Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Ìhè Nke Ụwa & Iyi Mmiri Si N'eluigwe
Ka ọnwa iri e mechiri ya ọnụ gabigara, Zekaraya mecharà kurú nwa ya nwoke ahụ ọ tụrụ anya ya nke ukwuu. Ugbu a, jirí ọnụ ya emeghere emeghe na ntị ya a kpogherè, o juru ya anya na nwa ya nwoke ga-abụ onye amụma nke Onye Kachasị Elu. Zekaraya burù amụma na ọmụmụ Jọn, na ọmụmụ Jizọs bụ ọbụbọ̀ nke ụbọchị ime mmụọ ọhụrụ.
Iji ṅụrịa nke ọma maka ìhè ahụ bịara, anyị kwesịrị ịghọta ụdị ọchịchịrị dị adị oge ahụ. Agba Ochie ji nkwa nke ìhè ọhụrụ na-abịanụ wee mechie, Agba Ọhụrụ ewee jiri yabụ ìhè wee meghee.
Aha ahụ bụ “Isi Iyi Nke Ụbọchị” e turù Mezaya abụghị nke a maara nke ọma. O si n'okwu Grik ana akpọ “anatole” nke a sụgharịrị dịka “ebe ọwụwa anyanwụ”. Ọ bụ otu okwu ejiri ugboro atọ kọwaa ndị nwoke amamihe ahụ sitere n'ebe ọwụwa anyanwụ na “kpakpando Ya dị n'ebe ọwụwa anyanwụ”. Kpakpando ahụ dị n'ebe ọwụwa anyanwụ bụ ìhè durula ha gaa n'ebe Ìhè n'Onwe Ya nọ, bụ Isi Iyi-Mmiri Nke Ụbọchị.
Ka afọ iri atọ gasịrị, Ìhè Nke Ụwa malitere ikuzi ihe, ịgwọ ndị mmadụ, na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ebe Judia. Ozi Kraịst nye ndị mmehie bụ ka ha tinye okwukwe ha na ntụkwasị obi ha na Ya. Nke a kpasurù ọchịchịrị o wee gbaa ọsọ. Ọ bụghị onye ọ bụla hụrụ ìhè n'anya, ọtụtụ ndị na-ahọrọkwa ịnọ n'ọchịchịrị.
Ekwensu gbalịrị ike ya igwepịa Isi Iyi Ahụ n'obe. Mana ka ụbọchị atọ gasịrị, ka anwụ malitere iké, ụmụ nwaanyị nọ hụ ka a kpọgidere Onye-nwe-anyị n'obe ma lie Ya bịara ite mmanụ gasị nwere isi ụtọ n'ahụ Ya, mana nụ na ụdị ọwụwa anyanwụ ọzọ mere. Ọ bụ ọwụwa anyanwụ nke S-O-N mere! E meriela Ọnwụ na Ọchịchịrị, ma Ọkpara Chineke esiwo n'ili bilie. Site na ihe ahụ eji enye ụmụ anụmanụ nri ruo na ili tọgbọrọ chakoo, Isi-Iyi Nke Ụtụtụ Ahụ wetara ìhè ọhụrụ.
Ekeresimesi n'eme ememe ọbịbịa nke ọwụwa anyanwụ mbụ ahụ. Ụbọchị ọhụrụ na ìhè ọhụrụ bịakwutere anyị n'ihe ahụ eji enye ụmụ anụmanụ nri dị oké ala. Mana a kà nwere ọwụwa anyanwụ nke na-abịa. Agba Ochie ji nkwa nke ọwụwa anyanwụ dị n'ihu wee mechie, Agba Ọhụrụ jikwa otù ahụ mechie. Nkwa a dị n'Isi akwụkwọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ. Ọwụwa anyanwụ a gá-abịanụ́ ga-adị iche n'ihi na ọwụwa anyanwụ niile mere bụ nke ọchịchịrị bù ụzọ nọrọ, mana nke a ga-eweta ìhè n'adịghị akwụsị akwụsị.
N'ihi na Jizọs n'Onwe Ya ga-anọchi anya anyanwụ na Jeruselem Ọ̀hụrụ ga-abịanụ. Anyị na Ya ga-anọgide ebighị-ebi kwa ebighị-ebi, Ya abụrụkwa isi ìhè nke anyị.
Ugbu a, anyị n'eche ka Ụbọchị ahụ bịa na mezuo.
Mgbe a mụrụ Kraịst, mmeghachi omume ndị mmadụ nye ọmụmụ Ya bụ nke ife Ya òfùfè na inwe obi mgbali elu, bụ nke ka n'eme ugbu a. Mana nye ndị kwere ekwe, Eze a amụrụ ọhụrụ bụ̀ ọṅụ nke obi niile agụụ Ya na-agụ. Ọ bụ Ya bụ Onye N'enye Ihe, bụrụkwa Onyinye Ahụ A N'enye. Ọ bụ olileanya m na Ọ bụ agụụ nke obi gị na ị ga-etinyekwu Ya n'obi gị oge Ekeresimesi a.
Nweta Akwụkwọ Agba Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa dị EFU nke so atụmatụ ihe ọgụgụ a bịa ebe a.
- Kedụ ka Isi-Iyi Nke Ụtụtụ Ahụ si eme ka ìhè bata n'ime ndụ m na ka m si eche echiche?
- Kedụ ka m kwesịrị isi meghachi omume nye ihe ndị ana ekpopụta n'ìhè na ndụ m?
- Kedụ ka nkwa nke ìhè n'adịghị akwụsị akwụsị n'ime Jeruselem Ọhụrụ ahụ si enye m olileanya ụbọchị taa?
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.
More