Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Iwu N'enye Nsogbu Meré Ka Amụma E Burù Mezuo
Jiri otu mkpaaka penụ̀ ya, Siza Ọgọstus nyere iwu ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ nke bụ́ na ndị niile ọ na-achị ga-alaghachi na ala nna ha ka a gụọ ha ọnụ. Jiri ọmụma otú ala ahụ niile Siza na-achị si wee saa mbara na buo ibu, Rom chọrọ inakwú ndị mmadụ ụtụ́ ma wukwuo ndị agha bụrụ ibu na ndị ka mma. Ọnụ ọgụgụ a bụ ezigbote ihe nsogbu nye ndị niile Ọgọstus na-achị, mana nke ahụ agbasaghi ya. Nke gbasara ya bụ iwulite na ichebe alaeze ya.
Mana ọ maghị na Chineke nọ n'eji iwu ọnụ ọgụgụ ahụ o nyere ịkpọbata alaeze dị iche nke n'enweghị ọgwụgwụ, Alaeze nke Chineke.
Mgbe ozi banyere iwu ahụ rutere Meri na Josef, ha bi na Nazaret, dị maịlụ iri itoolu n'ebe obodo Betlehem nọ, ma oge ọmụmụ Meri eruwo nso. Josef na Meri kwakọrọlà wee gawa njem Betlehem egbughị oge. Ọ bụ ezie na njem a nyere nnukwu nsogbu na ọ dịghị mfe, o nwere ihe nọ na-emenụ nke uche mmadụ apụghị ịtụ̀.
Afọ narị asaa gara aga, Maịka onye amụma burù amụma na ebe ọmụmụ nke Mezaya ahụ a tụrụ anya ya ogologo oge ga-abụ Betlehem. Ọ́ bụrụ na a mụrụ Jizọs na Nazaret, a bụghị Betlehem, Okwu Chineke agaghị emezu, nke ahụ ewee pụta na Ọ bụghị Onye Nzọpụta. Mana nsogbu a adịghị oké ukwu nye Chineke. O ji onye ọchịchị n'ekpere arụsị na iwu n'enye nsogbu burú ezinụlọ ahụ dị nsọ bugaa n'ebe ha kwesịrị ịnọ iji wee mezuo amụma Maịka.
Ka Meri n'agaje ịba Betlehem ime n'eme ya ewee ka nkụ, anyị aghaghị ichè ma o nweterè nkasi-obi na eziokwu ahụ bụ na Chineke agaghị ekwe ka ọ mụọ nwa ya n'okporo ụzọ. O nwere ike ịbụ na o cheterè okwu amụma nke Maịka nakwa na ọmụmụ nwa a o bù n'afọ agaghị emezu ruo mgbe ha batara Betlehem.
Ọtụtụ mgbe, anyị adịghị aghọta oge Chineke na ihe ndị n'emenu na ndụ anyị. Ka anyị si ahụta ihe n'enyé anyị ọtụtụ nsogbu, mana Chineke n'ahụzụ̀ ihe niile ma nke ukwu ma nke nta gbasara ndụ anyị wee n'arụ ọrụ site na ha niile iji mezuo uche Ya. Nwee nkasi obi oge ọzọ ihe ịna atụghị anya dapụtara na ndụ gị ma ọ bụ atụmatụ nke ndụ gị ọbụla agbagọọ ma ghọọ ihe n'enweghị isi. Iwu nke ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ Siza Ọgọstus nyere n'echetere anyị na Chineke nọ n'ọrụ oge niile n'ihe gbasara ụmụ mmadụ, ọ dịghịkwanu ihe pụrụ iguzogidè uche Ya.
- Olee otù Chineke si akpọm òkù ka m si bido hụtawa ihe ndị n'eme n'ụwa gburugburu n'ụzọ dị iche?
- Olee otù Chineke si akpọm òkù ka m malite iche echiche n'ụzọ dị iche mgbe atụmatụ m gasị nwerè ihe ndị rugidere ha ma ọ bụ mee ka ha ghara imezu?
- Olee otù m ga-esi ka kwugidesie ike ma nọrọ chịm mgbe-ọzọ atụmatụ m gasị ma ọ bụ ihe ndị m bù n'obi agaghị ka m siri tụọ?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.
More