Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Every Longing Heart

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Nwaanyị N'enweghị Ka Ọ Dị Ya Na Nnukwu Chi Ya

Ọ bụ nwaanyị n'alụbeghị dị na nke ga-atụ ime n'oge n'adịghị anya sitere na obodo na-abaghị uru bụ Nazaret. N'ile onwe ya anya n'ezie, ọ bụ mmadụ n'enweghị ihe bara uru ejiri mara ya. Ma, n'agbanyeghị nke ahụ, Mmụọ ozi Gebriel nwerè ozi maka ya kagburú ihe ndị ahụ niile. Ọ gwara ya na ihu-ọma Chineke bara ụba n'ebe ọ nọ nakwa na aga ahụta ya ka nwaanyị dị ngọzi oké elu karịa ụmụ nwaanyị niile... jetụbere ije n'elu ụwa.

Ihe ùgwù kasịnú bịakwutere ya bụ na ọ bụ ya ga-atụ ime wee mụọ Nwa Nwoke, Mezaya ahụ, Onye alaeze Ya agaghị enwe njedebe. Mana o nwere ike ihe kasị atụ na-anya maka ihe a gwara ya bụ na ọ ga-atụ ime Mezaya ahụ ma mụọ Ya na-amaghị nwoke.

Ọ bụrụ na o nwere nwaanyị kwesịrị ịtụ ezigbo egwù ma nwee obi mgbali-elu maka ozi gbasara afọ ime, ọ bụ Meri. Ọnọdụ ya pụrụ inyì nkọwa ma bụrụ nke nwere ike ikpó aha ya n'aja n'etiti ndị mmadụ. Mana nzaghachi Meri nye ozi e nyere ya abụghị nke ụwa a dịka onye wetere yabụ ozi. O kpughere otu obi n'eto nke ọma n'eziokwu nke Okwu Chineke nke n'enweghị ihe pụrụ ime ka ọ maa jijiji.

Egwú Meri, ma ọ bụ The Magnificat jupụtara n'otuto maka ihe Chineke meere ya na ụmụ Izrel na ndị agajè imu amụ. Ka ị na-agụ ya, tụlee ka obi Meri si jupụta na agụụ inye òfùfè na ekele.

1. O Nyere Ekele Maka Ihe N'eme Oge Ahụ

Site n'obi jupụtara n'otuto, Meri kpọrọ aha Chineke ihe karịrị ugboro iri abụọ, ma kelee Ya ugboro asatọ n'ihi ihe O mere. Obi ya kwekọrọ n'ihe Chineke nọ n'arụ na akụkụ niile nke ndụ ya. Ọchịchọ Meri kasinụ bụ ibuli aha Onye-nwe-anyị elu, na ime ka aha Ya dị ukwuu.

2. O Nyere Ekele Maka Ihe Ga-eme N'ihu

Meri hụrụ ọrụ nzọpụta nke ọdịnihu Chineke na-arụ site na nwa ọ mụrụ. N'agbanyeghị na ọ ka n'eto eto, ọ ghọtara nke ọma na Chineke agaghị ụzọ ụmụ mmadụ si eme ihe ma n'ebuli ohu dị ka ya elu.

3. O Nyere Ekele Maka Ihe Gara Aga

N'ihi nghọta ya zuru okè banyere Okwu Chineke, Meri ji anya obi ya wee n'ahu ọnọdụ ya pụrụ iche n'ìhè nke ihe Chineke merela ụmụ Izrel. Ọ hụrụ akụkụ ọrụ nke ya na mgbapụta ahụ zurú ọnụ nke Chineke, na-alaghachi na ọgbụgba ndụ nke Ebraham. Chineke dị nkwesị ntụkwasị obi n'oge gara aga ma ga-anọgide na-adị ikwesị ntụkwasị obi n'ihe niile ga-abịanụ ọ ga-eche ihu.

Meri bụ onye bụ ụzọ si na ya bụ ohu dị ala karịa nke Onye-nwe-anyị. Mana Chineke leferè ọnọdụ ya dị ala karịa anya wee nye ya nkwanye ùgwù kachasịnu O nyetụberè nwaanyị ọbụla.

Kemgbe oge Iv, anyị niile bụ ndị a mụrụ n'okpuru abụmọnụ nke mmehie, mana Nwa Nwoke ahụ Meri mụrụ dị iche na anyị. Nke a abụghị n'ihi na Meri adịghị mmehie kama ọ bụ n'ihi na Jizọs, bụ Onye a mụrụ site n'ike nke Mmụọ Nsọ, adịghị mmehie.

A gọziri Meri, egwú ya ewee n'egosipụta obi n'eto eto jupụtara na ekele na ịma mma nke Chineke. Tụlee okwu ndị o kwuru, ma mee onwe gị ka ibido n'akpa àgwà n'egosipụta obi na omume ya nke n'enweghị mpako na nghọta erughị eru ya n'ihu Chineke. Ka anyị na-eme nke a, anyị ga-ebido hụwa Chineke ka Meri si n'ahụ Ya, Ya bụ ezi agụụ nke obi anyị.

  • Kelee Chineke maka ndụ gị gara aga, ndụ ị n'ebị ugbu a, na ndụ gị na-abịa n'ihu. Kedụ ka ikwesị ntụkwasị obi Ya n'ebe ịnọ n'oge gara aga sịrị mee ka ịtụkwasịkwuo Ya obi na ndụ gị ugbu a na maka ọdịnihu?
  • Olee otú Chineke si atụgharị mmasị gị niile ka i wee hụkwuo Ya n'anya?
  • Olee otú Chineke si akpọ gị òkù ka ịmalite n'egosipụtakwu ekele ụbọchị taa?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Longing Heart

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Cara Ray maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://cara-ray.com