Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Ndị Akaebe N'erughị Eru & Ọñụ Ha Kachasị Ukwuu
Abalị ahụ dị ka puku abalị ndị ọzọ. Otù ndị ọzụzụ atụrụ nọ ọdụ gburugburu ọkụ ha mụnyerè wee n'akọ akụkọ ma n'agụ egwú gasị. Mana ozugbo, mbara igwe kerè abụọ, ìhè ebube nke mmụọ ozi ewee kpuchie anya ha ma mee ka obi ha maa jijiji n'ụjọ.
Kà ebube nke Chineke gbara ha gburugburu, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ hụrụ otu mmụọ ozi (o nwere ike ịbụ Gebriel) ka ọ n'ekwuputa ozi ọma nke ọmụmụ Kraịst, puku kwa puku ndị mmụọ ozi ọzọ ewee sochiri ya n'azụ wee na-agụ egwú otuto nye Chineke. Ihe niile ahụ n'emé dịka ákwà ekpughere nwa obere iji nye ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ntupenye agụm egwú mara mma n'aga n'ihu nke ìgwè mmụọ ozi nọ n'eluigwe.
Mana elee anya mmadụ niile gará inweta ọkwá ozi a si n'eluigwe, gịnị merè e ji burú ụzọ nye ya ndị ọzụzụ atụrụ uru ha dị ala?
Obi Chineke n'adịkarị nrọ̀ oge niile n'ebe ndị ọzụzụ atụrụ nọ. Eze kacha eze ndị ọzọ nke Ụmụ Izrel, Devid, bụ̀ bụ̀ onye ọzụzụ atụrụ, ma Mozis jeerè nna nwunye ya ozi dịka onye ọzụzụ atụrụ ọtụtụ afọ. N'agbanyeghị na aha nnukwu mmadụ ndị a so ha bụrụ ndị n'azụ atụrụ, ndị n'azụ atụrụ dị ala dịkarịa ala nà kà ọha mmadụ si ahụ ndị bara uru anya. Ọrụ ha n'arụ merè ka ha bụrụ ndị a n'ahụ ka ndị ruru unyi nke mere na ha enweghị ike iso mee ihe okpukperechi ndị Judaism.
N'agbanyeghị nke a, Chineke kpugherè ozi a dị ịtụnanya nye ndị ọzụzụ atụrụ ana amaghị ama, bụ́ ndị nwere ike ha bụ̀ ndị na-asọpụrụ Chineke. Akụkọ a jupụtara na ọdịiche gasị na ihe n'akpa ọchị. Abalị n'eji kpìì mbara igwe ya jupụtara na kpakpando, ìhè ebube n'ekpuchi anya dakwasịrị. Ndị nwoke egwù jidere, ndị mmụọ ozi jupụtara n'ọñụ ma n'agụ egwú zuterè. Ndị ọzụzụ atụrụ ana enweghị ihe eji ha kpọrọ agbanwerè ka ha bụrụ ndị na-ekwusa Oziọma. Ihe kacha akpa ọchị n'ihe a bụ na, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ na-elekọta ìgwè atụrụ enwere ike iji wee chụọ àjà n'ọdịnihu, dịka Atụrụ Nke Chineke a mụrụ n'ụlọ anụ dị ha nso. Ná osiiso ha ịgbará gaa hụ yabụ Nwa a mụrụ, ọ̀ bụ na ha pụrụ ịma n'oge ahụ na ha ji anya ha abụọ wee n'elele atụrụ àjà ikpeazụ — Atụrụ nke Chineke?
Ihe ahụ ahụrụ anya nà Chineke merè ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ bụrụ ndị bú ụzọ mata ozi ọma ahụ bụ̀, n'onwe ya, ozi ọma. Ọ bụghị ọtụtụ n'ime anyị bụ ndị ma ihe dịka ndị ụwa si tụọ, dị ike, ma ọ bụ bụrụ ndị a mụrụ na be eze. Chineke na-ahọrọ ihe ndị dị ibèríbè nke ụwa a wee gbagwojuo anya na obi ndị si na ha bụ ndị amamihe. Ọ bụrụ na ngunye anyị na ihe ndị dị nzuzu n'ime ụwa a gà-enye anyị oche-ihu n'ọkwá ozi kachasị ibe ya emetuberè, ka anyị gbaa ọsọ ọsọ debanye aha anyị! Akwadeberè ọkwá ozi nke ndị mmụọ ozi ahụ inye ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nnukwu ọṅụ, ọ bụkwa ebumnuche eluigwe na ọ gà-ewetakwara gị otu ọñụ ahụ ụbọchị taa. Amụọla Onye-Nzọpụta! Oziọma a na-ewetere anyị ọṅụ ka ọṅụ niile, ma ugbu a ruo ebighị ebi.
- Kedụ ka Chineke si akpọ m òkù ka malite n'eche echiche n'ụzọ dị iche ka m si ele ndị ọzọ anya?
- Kedụ ka Chineke si n'akpọ m òkù ka m malite n'eche echiche n'ụzọ dị iche ka m si ele onwe m anya?
- Kedụ ka ọkwá ozi a nke ndị mmụọ ozi sì emetụta ọṅụ m n'enwe ụbọchị-kwa-ụbọchị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.
More