Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Every Longing Heart

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Onye Nnukwu Nganga & Ezi Eze Ndị Juu

Mgbe ndị Mejai ahụ batarà Jeruselem wee jụọ ajụjụ banyere Eze ọhụrụ ahụ a mụrụ bụ́ nke ndị Juu, Herọd gbalịrị ike ya ikpuchì obi ọma-jijiji bịakwutere ya. Ọ ghọtara ihe ọbịbịa ndị nwoke amamihe ahụ na Jeruselem pụtara, ma mara nke ọma na ọ bụghị ebe ọbụla ka ha na-abịa. Ha nọ n'ozi nke ịkpụnye ezi Eze ndị Juu ahụ okpu-eze Ya, ma nke a bụ ihe nnukwu nsogbu.

Siza Ọgọstus nyere Herọd aha otutú “Eze Ndị Juu” dị ka ụgwọ-amara nye Nna ya, Antipata. Herọd abụghịdi onye Juu, ọ bụ onye Idumia. N'agbanyeghị otú o siri nweta aha otutú ya, Herọd kwenyere na ọ ya bụ ezi Eze ndị Juu na onye ọbụla ọzọ nwere ụdị aha otutú ahụ bụ ọnyà amaara ocheeze ya.

Ọchịchị Herọd ka na-adọ nkoró n'etiti ndị nkà mmụta ihe mere eme n'akụkọ nke mmadụ n'ihi na ọ bụ mmadụ jupụtara n'ọtụtụ ihe n'agbagwoju anya na obi. N'otu aka, ọ bụ onye n'ewu ihe n'enweghị atụ. Ihe o wurú kachasị buo ibu na nke a maara nke ọma bụ nrụgharị Ụlọ Nsọ Ndị Juu. Ọ sụghị aka n'iwepụta ihe niile dị mkpa iji wugharia ụlọ nsọ ahụ, nke mere na ọbụna ndị Rabbai, ndị n'ahụghị Herọd n'anya ma ọlị, n'ekwu okwu kwa mgbe banyere ịma mma nke ụlọ nsọ ahụ.

Mana, n'aka nke ọzọ, ihe ọma ọbụla Herọd merè, bụ nke omume obi ịta nkụ ya na egwù na-abaghị uru kpuchirì. Onye ọbụla ọ hụtara ka onye chọrọ inara ya ocheeze ya adịghị nchebe n'ihu ya, ọbụna ezinụlọ ya. Mgbe o cherè na Mariamne, nwaanyị ya ọ kacha hụ n'anya, na ụmụ ejima ya ndị nwoke, chọrọ inara ya ocheeze ya, o nyere iwu ka e gbuo ha niile.

Ya mere na mgbe Herọd nụrụ ozi na amụọla Eze ọzọ nke ndị Juu, ọ hutara ya na a chọrọ inara ya ocheeze ya wee kpọọ ndị Mejai ahụ ka ya na ha nwee nzukọ nzuzo. O nyere ha iwu ka ha zitere ya ozi ebe Eze ọhụrụ a nọ, ka ya wee feekwa Ya òfùfè. Mana n'ihi na adọrọ ndị Mejai ahụ aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwurù Herọd, ha si ụzọ ọzọ wee laa.

Ihe ọjọọ meré n'ihi onye araa chọrọ irapará n'ọchịchị bụ na ogbugbu n'enweghị isi merè. O nyere iwu ka e gbuo ụmụ nwoke niile ndị a mụrụ ọhụrụ ruo afọ abụọ bi na Betlehem.

Ndụ Herọd bụ ihe atụ maka ọgụ na mgba n'aga n'ihu dị n'etiti ike nke ọchịchịrị na ike nke ìhè dị n'ụwa. Ejí uche mmadụ lee omume Herọd anya, a ga-asị na ọ kpara ụdị àgwà ahụ n'ihi na ọ chọrọ iwepụ ndị niile ga-anapụ ya ọnọdụ ya dịka eze. Mana ejí anya ime mmụọ lee ihe ahụ o mere, a ga-ahụ na ọ bụ ọrụ aka Ekwensu, chọrọ igbu Jizọs Kraịst, Onye ahụ ga-egwepịa yabụ agwọ. (Jen 3:15).

Ọ bụrụ na Kraịst abụghị Eze ndị eze na Onye-nwe-nụ ndị nwenụ, Ọ̀ ga-aká n'abụ́ nsogbu nye ocheeze na ikike niile nke ụwa a? Eziokwu dịnụ bụ na ka afọ puku abụọ gafechara, ka ndị ụwa akabeghị chefuo ma ọ bụ lepu anya na Eze Ndị Juu ahụ a mụrụ na BETLEHEM, nke ahụ na-egosi Ọbụbụeze Ya n'ụzọ a na-apụghị ikpuchi!

Herọd achịchaala wee nwụọ, ma ndị ọchịchị ndị ọzọ. Jizọs ka bụ ezigbo nsogbu na Onye na-akpata obi ọma jijiji nye ndị ọchịchị niile nke ụwa a, ọ dịghịkwanu ihe pụrụ igbochi ọganihu nke Alaeze nke Chineke. Naanị otu Onye bụ Eze, aha Ya bụ Jizọs. Nzaghachi na omume kwesịrị ọbịbịa Ya bụ ịkpọ isi n'ala wee fee Ya òfùfè.

  • Kedụ ka ọmụmụ Jizọs si n'eyí ndị ọchịchị na alaeze nke ụwa a egwù ụbọchị taa?
  • Kedụ ka ọmụmụ Jizọs si n'emegide ma n'agbagide nnakwere m ka Ọ chịa ma biri ka Eze n'ime ndụ m?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Longing Heart

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Cara Ray maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://cara-ray.com