Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Every Longing Heart

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Mmụọ Ozi N'eyi Egwù Na Azịza Ejighị Uche Wee Zaa

Zekaraya chè na ọ nụchaghí ntị mgbe a tụrụ ihe ụtụ ahụ, ọ wee ma ya. Dị ka onye nchụàjà, ọ chụọla àjà ọtụtụ puku anụmanụ, mana ọ dịbeghị mgbe o nwere ùgwù nke ịchụ àjà nsure ọkụ n'ime Ebe Ahụ Dị Nsọ. Zekaraya kubarà nnọọ ezigbo ume tupu ya abaa n'ime ebe ahụ dị nsọ.

Nwa ọkụ ọ kpa n'aka ya mere ka ònyìnyò gasị n'akwugharí n'ime ụlọ ahụ. N'aka nri ya, ọ hụrụ tebụl achịcha nsọ ahụ, n'aka ekpe ya, ọ hụrụ ihe nkwụnye oriọna ahụ eji ọlaedo wee mee, ma n'ihu ya, ọ hụrụ ebe nchụàjà ahụ nke insensị. Ọ mụnyerè insensị ahụ n'esi ísì ụtọ ọkụ wee weda isi ya ka o kpee ekpere. Mgbe o kpecharà ekpere wee meghee anya ya, ọ hụrụ ya site n'akụkụ anya ya.

Guzò na ònyìnyò ndị ahụ bụ ihe e kere eke kachasị dị egwù na dị ịtụnanya ọ hụtụbela na ndụ ya. Ọ bụ mmụọ ozi Chineke, Gebriel.

Ọ bụ ezie na ọdịdị Gebriel na-akpali ezigbo egwù, mana o mesịrị Zekaraya obi ike ka ụjọ ghara itú ya ma gwa ya na ya ji ozi ga-agba ntị gharii bịa. Ekpere Zekaraya na nwunye ya Elizabet maka nwa nwoke ga-abịa na mmezu, ma nwa a ga-adị egwù n'ihu Onye-nwe-anyị. Nwa nwoke a arịrịọ̀ arịrịọ ya ogologo oge ga-abụ onye nchụzọ̀ maka Mezaya ahụ.

Naanị nsogbu dịnụ bụ na Zekaraya na nwunye ya agafeela afọ ha abụọ nwere ike imutanwu nwa. Ya mere Zekaraya jiri jụọ Gebriel, "Kedụ ka nke a ga-esi wee mee?" Mmụọ ozi Chineke ewee za ya si, "Abụ m Gebriel, m na-eguzo n'ihu Chineke." N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, anya gị abụọ ị jiri hụ m ó kwesịghị izurù gị ikwete na ihe m gwara gị ga-abịa na mmezu, Zekaraya?

N'ezie, Zekaraya maara na Chineke pụrụ iza ekpere ya, mana iji chebe atumanyá ya gasị, o kpebiri n'ime obi ya na Chineke agaghị eme ihe O kwuru.

N'ihi ekweghị ekwe ya, Gebriel kụrụ Zekaraya nzuzu. Ọ pụghị ịnụ ihe ma ọ bụ ikwu okwu. Mana, ekweghị ekwe niile ọ ha abụghị nzuzu? Mgbe anyị ekweteghị ihe e kpughere n'ime Okwu Chineke, anyị na-egosipụta nzuzu nke ime mmụọ.

Ọ bụ ezie na Zekaraya ji obi abụọ nye Gebriel nzaghachi na mbụ, mana "oge e mere ka uche ya dị ezigbo nhazi" nyerelà ya aka ka o ji ndom anya hụzie ihe niile. Mgbe e mechara tọhapụ ire ya n'agbụ, ọnụ ya jupụtara na ekele nye Chineke. Jirí nkwuwa-okwu ya enyeghachịrị ya, o jirilà ọnụ ya gọzie Chineke kama ikwu okwu obi abụọ.

Ruo afọ iri kwa iri, Zekaraya na nwunye ya Elizabet cherè na Chineke si 'mba' nye agụụ na ọchịchọ nke obi ha ahụ, mana ha amaghị na ihe Chineke nọ na-agwa ha bụ na oge nke arịrịọ ha ahụ imezu erubeghị. Nọgide n'ekpe ekpere, na-atụkwasị Chineke obi, n'erubekwa isi nye Chineke! Ị̀ maghị ihe Chineke nọ n'arụ n'elu ekpere gị ndị ichè na Ọ zabeghị.

  • Ebee ka m nọ n'agbagha uche n'ihe Chineke kpughere n'ime Okwu Ya?
  • Kedụ ka m ga-esi gosipụta ụdị ntụkwasị obi (ọbụna na o zughị ezù) nke Zekaraya na Elizabet n'iká nọgide n'ekwenye na nkwa ndị Chineke kwerè m ọbụna mgbe ọ dị m ka m kwụsị itinye obi m na ha?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Longing Heart

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Cara Ray maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://cara-ray.com