Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Obi Niile Nke Agụụ N'agụIhe Nhụchatụ

Every Longing Heart

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ndị N'ekiri Ihe N'eme Na Mbara-Igwe N'amaghị Chineke Dị Njikere Ife Òfùfè

Mgbe ndị nwoke amamihe ahụ na ngwongwo ha kpụbatarà n'ime Jeruselem, ha merè ọtụtụ ụ̀zụ̀. Ndị a si ebe tere anya bịa jùrù ndị mmadụ anya ka ha nọ n'akpagharí n'ebe gasị a na-azụ ahịa wee n'aju ese ebe Eze ahụ a mụrụ ọhụrụ nọ.

Ndị niile site na ndị n'ere mkpụrụ-osisi ruo na ndị isi nchụàjà ferè isi ha na ha amaghị ihe ndị ọbịa a na-akọ. Ọ gaarà adị ndị nwoke amamihe a kà ihe mgbagwoju anya na ndị a mụụrụ Eze, amaghị ebe Ọ nọ, ma ọ bụ debe ahụ kà ha nọ n'echere Ya. Ọ̀ bụ̀ nà ha amaghị ihe Okwu Chukwu ha kwuru?

Afọ narị isii gara aga, ka o bi ná-ndokpú agha n'ime Babịlọn, Daniel burù amụma gbasara oge ọbịbịa Mezaya ahụ. Amụma ndị ahụ o burù kpalirì mmasị ndị mejai ahụ, ha wee jiri nwayọọ na nlezianya, jiri ile anya na kpakpando, gbakọọ mgbe Mezaya ahụ gà-abịa n'ụwa.

Afọ narị kwa narị, ka ha nọ n'eme nchere. Mgbe kpakpando ahụ pụtara, ha maarà na oge ọbịbịa Mezaya ahụ erula. Ha wee bujuo ịnyịnya-ọzara ha onyinye dị iche iche wee zọpụ njem ịga chọta ebe Eze ahụ a mụrụ ọhụrụ nọ.

Ndị nwoke amamihe ahụ, ma ọ bụ ndị mejai ahụ, bụ ebo ndị nchụàjà n'amaghị Chineke sitere na alaeze ndị Midia na ndị Peshia. Ọ bụghị naanị na ha mụrụ ọmụmụ nlele eluigwe na kpakpando mana ha kpakwarà nnukwu ike na ọchịchị. Ha bụ ndị amaarà dịka “Ndị N'echi Eze” n'oge ha, ọ dịghị Eze Midia ọbụla ahụrụ anya ma ọ bụ mara ka Eze ndị mejai n'echighí ya ma ọ bụ kweta na ọ ga-abụ Eze. Ndị a n'echi Eze nọ na njem nke ichi Eze Ndị Eze echichi.

Ya merè na ka Ndị Ụmụ Izrel nọ n'ehi ụra nke ime mmụọ, ndị nwoke amamihe ahụ ji obi ha niile n'eme nchere maka Mezaya ha. N'amaghị ebe ha pụrụ ihu Ya, ha garà Jeruselem wee bido juwa ese Ya ebe ahụ.

Ọ bụrụ na i jighị n'aka ma ọ bụ obi gị ekwetaghí na nwa ahụ nọ n'ime ihe eji enye ụmụ anụmanụ nri bụ Eze nke Ụwa, a na akpọ gị òkù ka i mee ka ndị nwoke amamihe ahụ merè wee chọọ Ya. Ọ nọghị na nzuzo ma O kwewo nkwa na anyị ga-achọta Ya mgbe anyị ji obi anyị niile chọọ Ya. Meghee Okwu Chineke wee malite ịgụ Ya. Mgbe i maliterè mewe nke a, i gà-akpa àgwà ka ndị nwoke amamihe ahụ ndị nwere nkwesi-ike na ha achọtawo yabụ Eze, wee daa n'ebe ukwu Ya nọ nye Ya ezigbo òfùfè. Ọ bụ Ya bụ̀ agụụ nke obi ụmụ mmadụ niile. Ndị nwoke má ihe kà n'achọ ịhụ Ya wee fee Ya òfùfè. Ngị kwanú?

  • Ọ̀ n'atụ gị n'anya na ndị n'amaghị Chineke nwerè mmụọ ọsọ ọsọ ife Eze Jizọs òfùfè karịa ndị Juu si na ha mà Chineke? Gịnị kpatarà o ji tuo gị n'anya ma ọ bụ ọ tụghị gị n'anya?
  • Ndị nwoke amamihe ahụ kwafụrụ ọtụtụ akụ (ma ego ma oge) iji chọta azịza gasị nye ajụjụ ha gasị gbasara Eze ahụ na kpakpando Ya. Kedụ òtù i gà-esi ji obi ngwa ngwa chọọ azịza gasị nye ajụjụ ndị i nwerè banyere Ya?
  • Gịnị ka Chineke na-akpọ gị òkù ime banyere nke a?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Longing Heart

Na abụ Ekeresimesi nke Charles Wesley a maarà nke ọma, "Bịa, Gị Bụ́ Jizọs A Tụrụ Anya Ọbịbịa Ya Ogologo Oge,” anyị na-agụ́ na Jizọs bụ ọṅụ nke obi niile nwéré agụụ maka Ya. Na Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, chọpụta kà ntụziaka Chineke n'omume ụmụ mmadụ na azịza gasị nye ọbịbịa Ya, sị ekpughe agụụ gasị nke obi anyị. Site na ndị eze na ndị ọchịchị ruo ndị ọzụzụ-atụrụ na ụmụ nwaanyị n'amaghị nwoke, ọbịbịa Jizọs na-ekpughe ihe anyị kpọrọ ihe karịsịa. Chọta Ya ka Ọ bụrụ ọṅụ nke obi gị n'Ekeresimesi a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Cara Ray maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://cara-ray.com