Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

Ụbọchị Nke Asaa: Ndị Mejai

Ndị mejai, ndị a makwaarà dị ka ndị amamihe, sì n’ebe ọwụwa anyanwụ gaa chọta Jizọs. Ọtụtụ ndị nkụzi Akwụkwọ Nsọ kwenyerè na ndị ikom a mụrụ̀ sayensị nke mbara igwe, ma ọ bụ ihe anyị na-akpọ astronomy taa. Ha kwenyerè na ndị mejai bụ̀ ndị nwere amamihe, ndị bara ọgaranya na ndị a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu. Ọ bụ ezie nà Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị mmadụ ole ndị mejai gara hụ Jizọs, ozìzì anyị mà àmá bụ na ha dị atọ. Nke ahụ bụ n’ihi na ha wetarà Jizọs onyinye oké mmesapụ-aka atọ nke ọla-edo, frankincense, na myrrh.

Ndị nkuzi Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị mejai abịarughị ebe Jizọs nọ ruo mgbe Ọ dị ihe ruru ọnwa iri na isii ma ọ bụ iri abụọ na anọ. Mgbe ha banyere n’ime ụlọ ebe Jizọs nọ wee lekwasị Ya anya, ha gburu ikpere n’ala, fee Ya òfùfè, ma nyefee Ya onyinye ha jiri bịa. Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịgwa Eze Herọd ebe Jizọs nọ, ebe ọ bụ na Chineke mà na Herọd chọrọ igbu Jizọs. N’iruberé Chineke isi, ha sì ụzọ dị iche laghachi n’ụlọ ha dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.

Ndị mejai bụ ndị Jentaịl mbụ, n'abụghị ndị Juu, a kpọtụrụ aha ha n'Akwụkwọ Nsọ, bù ụzọ fee Jizọs òfùfè dị ka Mezaya ahụ. Ha ghọtarà ihe ọmụmụ Jizọs pụtara. Chineke n'Onwe Ya abịawo n'ime ụwa dịka mmadụ—leenú onyinye dị oké mmesapụ-aka siteré n'elu-igwe! Ha zaghachiri site n’inyeghachi Ya ihe n’ụzọ mmesapụ aka.

Ihe Omume Ezinụlọ: Maka ihe omume a, mee nụ̀ mmesapụ aka dị ka ezinụlọ. Kpọọ ụmụ gị ka ha nyepụ̀ ihe egwuregwu ha nwerè ma ọ bụ jiri ego nke ha zụta onyinye nye ezinụlọ nọ na mkpa. Soro ụmụ gị gaa nye onyinye ahụ. Ma ọ bụ dùrú ụmụ gị ka ha nye ego nke ha n’onyinye nke ụka. Bịakọtanụ̀, tụlee ụzọ ndị ọzọ gị na ụmụ gị ga-esi n'emesapụ aka ma nyekwuo onyinye dị ka ezinụlọ. Jìrí ihe omume a tụlee otú ịhụnanya Jizọs nwerè n’ebe anyị nọ si bụrụ onyinye e nyerè anyị, na otú otu ụzọ isi nyeghachi Ya ihe bụ site n’imesapụ aka n’ebe ndị ọzọ nọ.

Ihe Omume Ezinụlọ:

• Kedụ ihe kachasị masị gị i nyerè mmadụ?

• Kedụ kà inyepụ̀ ihe ahụ siri mee gị na ahụ na n'obi?

Emepụtarà atụmatụ ihe ọgụgụ a site na akụrụngwa ọzọ. Mụtakwuo ihe na www.25ChristmasStories.com

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara