Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Ụbọchị Nke Abụọ: Meri

Meri bụ nne Jizọs. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe dị ezigbo ịtụnanya? Gịnị bụ uche gị banyere ihe kpatara Chineke jiri họrọ ya maka ọrụ nke ahụ dị oké mkpa? Ị̀ chè na Meri bụ adaeze? Ma ọ bụ ikekwe, ọ bara ọgaranya? Ị̀ chè na ọ bụ onye ámà àmá? 

Meri abụghị nke ọ bụla n'ime ihe ndị a. Meri bụ nwa agbọghọbia ma dị ogbenye. Ọtụtụ ndị nkuzi Akwụkwọ Nsọ kwenyerè na Meri dị ihe dị ka afọ iri na anọ mgbe ọ tụụrụ ime Jizọs n'ihi na nke ahụ bụ afọ ụmụ agbọghọ ji alukarí di n'oge ahụ. Meri bikwa n'otu obere obodo na-abaghị oké uru. Karịa nke ahụ, ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, nke pụtara na ọ ká pụghị ịmụ nwa. Nà-eto eto. Dị ogbenye. Amaghị ya ámá. Apụghị ịmụ nwa. Nke ahụ ọ dị ka onye ị pụrụ ịhọrọ ka ọ bụrụ nne Jizọs? Ikekwe ị gaghị eme ụdị nhọrọ ahụ. Mana Meri dị umeala n'obi.

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na Chineke na-ebuli ndị dị umeala n'obi elu, ndị n'etinyekari Chineke n'ihu ọbụna na ime otù ahụ ga-efu ha ihe. Ịdị umeala n'obi bụ gị adịghị etù ọnụ banyere onwe gị na ijere ndị mmadụ ozi atụghị anya ka e too gị. Onye dị umeala n'obi n'akpa àgwà dị ka Chineke Ọ n'elele ihe niile ọ n'eme. Chineke họọrọ Meri, nwa agbọghọ nke na-adịghị mkpa n'anya ụwa, ka ọ bụrụ nne nke Onye-Nzọpụta nke ụwa. N'ihi gịnị? N'ihi na àdím umeala n'obi nke Meri doro anya mgbe ọ zara Gebriel Mmụọ Ozi sị, "Ahụrụ m Chineke n'anya. M ga-eme ihe ọbụla Ọ si m mee."

Ihe Omume Nke Ezinụlọ: Kpọkọta flash laịt niile, lantan eletrik, ma ọ bụ obere lantan gasị unu pụrụ ịchọta. Kpòsá ha niile n'elu tebụl. Gbanye ha niile. Kpaanụ̀ banyere ọdịiche dị n'etiti nke ọ bụla. Gaghariá nụ n'ime ụlọ unu ma kparịtanụ̀ ka ọkụ ndị unu gbanyere si dị iche n'ebe flọ lampụ na tebụl lampụ gasị nọ. Jụọ nụ̀ onwe unu, "Kedụ flash laịt kachasị amasị onye ọ bụla n'ime anyị?" na "Enwerè lampụ i na-agaghị eji wee mee ihe n'ihi na ọ jọrọ njọ?" Kpebie nụ̀ lampụ kachasị jọgbuo onwe ya. Mgbe unu mechara nke a, gụkọta nụ̀ 1 Samuel 16: 7. Kparịta nụ̀ nà n'agbanyeghị kà lampụ ọbụla si dị n'ile anya, ihe kachasị mkpa banyere ya bụ ọkụ si n'ime ya apụta. N'otu aka ahụ, n'agbanyeghị otù esi mazuo mmadụ n'ụwa, ịma mma onye ahụ, ka onye ahụ si jupụta na nkà, ma ọ bụ baa ọgaranya na mpụta, ihe Chineke n'ele anya bụ ìhè nke si n'ime obi nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ apụta. Obi Meri bụ ìhè n'enwu nke ukwuu n'anya Chineke!

Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Nke Ezinụlọ:

• Kedụ otu ihe ị cherè n'ime obi gị ịchọrọ imere mmadụ ọzọ iji gosipụta ịhụnanya Chineke mana i mebeghị ya?

• Ị̀ gà-eme ihe ahụ ọbụna na ọ dịghị onye n'ele gị anya, na ọ dịghị otito ọbụla i gà-anata?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara