Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Ụbọchị Nke Isii: Ndị Mmụọ Ozi

Na Baịbụl, anyị na-agụkarị banyere ndị mmụọ ozi na-ezigara ndị Chineke ozi. Ì chetarà Gebriel? Ozi o ziterè Zekaraya na Meri kpaliterè akụkọ Ekeresimesi otú anyị si mara ya. E wezụga Gebriel, Maịkel bụ naanị mmụọ ozi ọzọ anyị maarà aha ya. Ma ọtụtụ ndị ọzọ dị! Baịbụl gwarà anyị na ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi na-efe Chineke, n'ejere Ya ozi, n'emekwa ihe O kwuru. Mgbe ụfọdụ ị nwerè ike izute mmụọ ozi n’amaghị ya (Ndị Hibru 13:2).

Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi abụghịcha ndị mara oké mma, ndị dị nwayọọ, ndị nwere nkù anyị n'ahụkarị na ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ndị mmụọ ozi dị ka ndị nwere “ike dị ukwuu” ná-eruberé Chineke isi (Abụ Ọma 103:20). Ikekwe ọ bụ ya merè, mgbe ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ mmụọ ozi ahụ

ebube Chineke gbara gburugburu, na mpaghara ala ahụ, egwù tụrụ ha. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwù” (Luk 2:10). Mgbe ahụ, n'otu oge, ọtụtụ ndị mmụọ-ozi merè ka igwe abalị nke ndị ọzụzụ atụrụ ahụ chakee, dị ka ndị ozi mbụ kwusaarà ụwa ọmụmụ nke Onye Nzọpụta. Jírí ọbịbịa dị ike, ndị mmụọ ozi ahụ ziri ozi n’adịghị ka nke ọ bụla ọzọ: Ìhè nke ụwa dum—Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs—abịawo! Ike Ya ga-emeri ọchịchịrị nke mmehie, otu mgbe na oge niile.

Ihe Omume Ezinụlọ: Ọ bụghị nanị na ndị mmụọ ozi ahụ torò Chineke, ha merè ka eluigwe abalị nke ndị ọzụzụ atụrụ ahụ chakee. Ha ji ọmụmụ nke Mezaya ahụ e kwere nkwa Ya kwusaa mmeri megide ike ndị iro.

N'abalị a, onye ọ bụla yiri uwe ura Ekeresimesi ya. Meenụ popcorn. Banye nụ̀ n'ime ụgbọ ala unu. N'anyagharị nụ na-eri popcorn na-ele anya nà ụlọ ndị achọrọ mma na-enwu n'igwe abalị n'ime na gburugburu ebe unu bi. Kwuonụ ka ọkụ ekeresimesi na-egbuké egbuké si enwe ike itiwa ọchịchịrị wee mee ka ọkụ dị ebe niile. N'otu aka ahụ, mgbe anyị na-eso Jizọs, Onye bụ "Ìhè nke ụwa," anyị dị ike 'ịghara ije ije n'ọchịchịrị' n'ihi na anyị 'nwere ìhè nke ndụ' na-enwu n'ime anyị (Jọn 8:12).

Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Nke Ezinụlọ:

• Gịnị ka i chè “ije ije n'ìhè” bụ?

• Gịnị bụ uche gị ihe kpatara anyị ga-eji kpee ekpere maka iké iji mee otù ahụ?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara