Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ụbọchị Nke Ise: Ndị Ọzụzụ Atụrụ

Dị ka Meri, bụ́ nne Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ bi n’oge Jizọs abụghị ndị ahụrụ dịka ndị bara uru. A naghị ele ha anya dịka ndị ọkwá ha dị ogo. Ịbụ onye ọzụzụ atụrụ bụ ọrụ siri ike, a na-ahapụkwa ọrụ ahụ n'aka nwa kasị nta n'ezinụlọ. Ọbụna Devid, tupu ya aghọọ eze, bụ onye e legharà anya mgbe ọ bụ nwa-okoro na-azụ atụrụ. N'agbanyeghị nke ahụ, Chineke na-egosipụtakarị Onwe Ya nye ndị ana-eleghara anya n'ụwa iji gosi na ihe dị n'ime obi anyị bụ ihe ndị dị Ya mkpa.

Na Luk 2, ọ fọrọ nke nta ka ụtọ dị n'olu ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dachie anyị ntị ka ha na-agba ọsọ gaa Betlehem ịchọta Jizọs. Mgbe ha ji anya ha hụ Jizọs, ha sọpụụrụ Ya, nke pụtara na ha hụrụ ihe niile banyere Ya n'anya. Ka ha na-alaghachi n'ebe atụrụ ha kpòsacharà, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ agbachighí nkịtị n’ihe ha hụrụ.

Ha gwarà onye ọ bụla ha hụrụ otú ha si hụ Ya n’anya! Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, kà Ọ n'ezi ozìzì, Jizọs sịrị, “A bụ M Onye-ọzụzụ-atụrụ-ọma: Onye-ọzụzụ-atụrụ-ọma na-atọgbọ ndụ Ya maka atụrụ Ya” (Jọn 10:11). Jizọs na-ekwu maka ịnwụ n'obe iji kwụọ ụgwọ mmehie anyị. Ikekwe ọ bụ ya merè Chineke ji jiri ndị ọzụzụ atụrụ a nwere obi ụtọ dịka ndị mbụ Ya ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma banyere ọmụmụ Jizọs!

Ihe Omume Ezinụlọ: Aịzaya onye amụma dere, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezi ozi ọma si maa mma n’elu ugwu, ndị na-ekwusa udo, ndị na-ezisa ozi ọma, ndị na-ekwusa nzọpụta, ndị na-asị Zayọn, ‘Chineke gị bụ Eze!'” (Aịzaya 52:7 NIV) Wèré anya obi gị hụ ka ụkwụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ si apiagharí n'akụkụ na ebe niile nke obodo n'ụtụtụ Ekeresimesi ahụ ka ha na-ekwusa Ozi Ọma nke Ọmụmụ Jizọs! N'abalị a, wèré ụkwụ gị weta Ozi Ọma. Malite n'ụlọ gị. Gị na ezinụlọ gị kpekọọnụ̀ ekpere ma rịọ Chineke ka Ọ mụbaa ụzọ unu si enye Ya òfùfè. Mgbe unu mecharà nke ahụ, mee nụ̀ ngagharị ekpere gburugburu ebe unu bi, n'ekperé ezinụlọ ọbụla unu hụrụ ekpere. Jìrí ihe omume a dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ maka ịgwa ụmụ gị okwu gbasara otú ha ga-esi keritara ndị gbara ha gburugburu ịhụnanya Jizọs.

Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Nke Ezinụlọ:

• Kedụ ihe ị hụrụ n'anya nke ukwuu nke na ị pụghị imechi ọnụ gị ịgwa ndị mmadụ maka ya (ihe ụmụaka ji egwù egwuregwu, enyi ọma gị, ihe ncheta tọrọ gị ụtọ, wdg)?

• Ọ̀ dịtụla mgbe ị ji ụdị mmasị na obi ụtọ ahụ gwa mmadụ banyere Jizọs?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara