Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Ụbọchị Nke Mbụ: Devid

Ọ̀ bụghị naanị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, O nwekwarà nne na nna n'oge Ya n'ụwa. Papa Jizọs, Josef, nabatarà Ya n'ezinụlọ nke Devid, Mama Ya, Meri, bụkwa onye ọbara Devid. Ọ bụrụ na ị ghọtaghị nke a, onye a n'ekwu maka ya bụ Devid, nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ meriri Golayat! Ihe nke a ọ dịghị ịtụnanya? Jizọs ghọrọ nwa nwa Devid (agbụrụ setírí na too ogologo rú iri abụọ na asatọ), nke n'emezu amụma e burù afọ narị kwa narị na mbụ gbasara Mezaya ahụ na-abịa gá-esité na agbụrụ Devid (2 Samuel 7: 12-16).

Ndị bi mgbe a mụrụ Jizọs maarà onye Devid bụ. O toliterè ghọọ eze ma dee akwụkwọ Abụ Ọma. Mana nke kachasị mkpa, okwukwe Devid torò, e wee mara ya dịka "nwoke ihe ya na-amasị obi nke [Chineke] nke ukwuu" (1 Samuel 13:14). Mgbe ọ bụla a kpọrọ Jizọs "Nwa nke Devid" n'ime Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ site n'ọnụ ndị nwere okwukwe na Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa, na Ọ bụ Onye Mgbapụta ahụ a tụrụ anya ya. Ha kwenyerè na Jizọs nwerè ikike ịnapụta ha n'ọrịa na ntaramahụhụ.

: Ihe Omume Nke Ezinụlọ Bú ụzọ̀ mee ihe eji megharịa ọnụ pụrụ iche, mana agwala ụmụ gị! Nke mbụ, were ákwà kechie anya ha. Wee dùrú ha mee njegharí n'ọtụtụ ihe a n'eme eme. Tupu gị malite ihe omume ọbụla, jụọ ụmụ gị ma ha kà tụkwasịrị gị obi. Weta kandụl ma ọ bụ ihe ọbụla nwerè ísì ọma wee jụọ ha kà ihe ahụ si ésì. Mgbe ha mecharà nke ahụ, dùrú ha baa na ebe ha gà-akwọ aka ha. Nke ikpeazụ, dùrú ha baa na kichin. Si ha meghee ọnụ ha. Tinye nwa ngaji ihe mmegharị ọnụ ahụ pụrụ iche n'ime ọnụ ha! Wepụzie ihe ndị ahụ iji kechie ha anya. Jụọ ụmụ gị kà ọ dị ha ime njegharí ahụ niile n'ìsì. Egwù ọ tụrụ ha? Ha tụkwasịrị gị obi na ọdịghị ihe ọjọọ ọbụla gá-emé ha? Gị na ha jiri ihe a unu merè kparịta ụka banyere itinyè okwukwe n'ime Chineke ọbụna mgbe anyị na-amaghị ebe O dù anyị eje.

Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Nke Ezinụlọ:

• Gịnị kà itinyè okwukwe gị na mmadụ pụtara?

• Ị̀ nwerè ike icheta ihe atụ nke mgbe ị tinyerè okwukwe gị na Jizọs O wee zọpụta gị?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara