Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Ụbọchị Nke Anọ: Jizọs

Jizọs bụ̀ akụkọ Ekeresimesi! E wezụga Jizọs, anyị niile gaarà enwe nnukwu nsogbu. Anyị niile chọrọ Onye Nzọpụta ga-anapụta anyị na mmehie. Dị ka mmụọ ozi ahụ kwuru, ọbịbịa Jizọs bụ “ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ nile” (Luk 2:10). Chineke-Nna hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nke na Ọ họọrọ izite Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya n’eluigwe ka a mụọ Ya dị ka nwa ọhụrụ.

Ma ọ bụghị ebe a ka ozi ọma kwụsịrị. Jizọs hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nke na O toliterè, bie ndụ zuru okè, ma nwụọ n’ọnọdụ anyị ịta ahụhụ n’ihi mmehie anyị. Mana Jizọs si n'ọnwụ bilie kà ụbọchị atọ gasịrị! Ọ rigoro n’elu-igwe, wee ká biri n’ebe ahu taa. Ebe ọ bụ na Jizọs dị ndụ, anyị na Chineke nwerè ike ịdị ná mma ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi. Nke a bụ ozi kachasị mma! Mgbe anyị kwerè na Jizọs, anyị na-aghọ ụmụ Chineke. Ọ na-eduzi anyị, na-eme ka ụlọ Ya dịrị n'ebe anyị nọ, na-aghọ enyi anyị, na-akụziri anyị ụzọ Ya, na-anụ ekpere anyị. Ọzọkwa, anyị pụrụ ịhụ ndị ọzọ n'anya otú Chineke si hụ anyị n'anya. Jizọs kwuru, “Dịka Nna M siri hụ Mụ Onwe M n'anya, Mụ onwe M hụrụ unu n'anya otù ahụ: Nọgidenụ̀ n'ihụ-n'anya M” (Jọn 15:9). Ịhụnanya a na-enweghị atụ bụ isi ihe niile nke Ekeresimesi. Ọ bụ ozi kachasị mma anyị pụrụ ịnụ!

Ihe Omume Nke Ezinụlọ: Kwadebe ememe oriri na ọṅụṅụ maka ụbọchị ọmụmụ Jizọs. Ị nwere ike họrọ ịme oriri na ọṅụṅụ n'ụbọchị Ekeresimesi ma ọ bụ mgbe ọ bụla ọ dabara ka gị na ezinụlọ gị si kpaa. Otú ọ sịla dị, soro ụmụ gị rụọ ọrụ taa iji hazie oriri na ọṅụṅụ maka Jizọs. Zụrụ ihe ndị ị ga-eji mee keekì. Zụrụ balụn ma ọ bụ ihe ịchọ mma ndị ọzọ. N'ụbọchị oriri na ọṅụṅụ ahụ, gụọ nụ̀ egwú Ekeresimesi na "Hapí Betde." Kọọ nụ̀ akụkọ gasị otú Jizọs si gbanwee ndụ unu. Mee ememe a ka ọ pụọ iche nye ezinụlọ gị. Mepụta ihe na-akpali mmasị gị na ezinụlọ gị gà n'atụ anya ya ime kwa afọ.

Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Nke Ezinụlọ:

• Kọwaa ozi ọma otù Jizọs si wee hụ gị n'anya nke ukwuu.

• Olee otú ịhụnanya Jizọs nwerè n’ebe ị nọ si gbanwee otú i si eche echiche banyere Ekeresimesi?

• Olee otú o si agbanwe otù i si emeso ndị ọzọ omume? Nye ihe atụ gasị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

7 Days of the Christmas Story: An Advent Family Devotional

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele B&H Publishing maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.bhpublishinggroup.com/25-days-of-the-christmas-story/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara