Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka EzinụlọIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Atọ: Josef
Josef bụ onye kapinta, chọrọ ịlụ Meri, mgbe ọ gwara ya na ọ gaje ịmụ nwa. Josef nwerè mkpebi siri ike ịme. Ebe ọ bụ na ha alụbeghị di na nwunye ma Meri dị ime, ọ maara na ndị Juu agaghị anabata ụdị ihe ahụ ma Meri gà-adabakwa na nsogbu. N'ihi na Josef hụrụ Meri n'anya, o merè atụmatụ ichebe Meri ma jiri nwayọọ gbubie njikọ dị na etiti ya na ya. Mana ka ọ n'eche nke a, mmụọ ozi nke Onye-nwe-anyị bịakwuterè Josef na nrọ. "Atụla ụjọ ịlụ Meri," ka mmụọ ozi ahụ kwuru. "Nwa ahụ o bù n'afọ siterè na Mmụọ Nsọ."
Chineke họọrọ Josef ka ọ bụrụ nna Jizọs n'ụwa. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya? Na omenala ndị Juu, ọ bụghị ọtụtụ ụmụ nwoke ga-azụlite nwa na-abụghị nke ha. N'agbanyeghị ihe ndị ọzọ cherè, Josef bụ nwoke nke n'eguzosi ike n'ihe ziri ezi. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, Josef ekwughi naanị na o kwerè na Chineke; o mekwarà ihe Chineke chọrọ ka o mee. Josef zụliterè Jizọs dị ka ọkpara ya, kụziere Ya ka esi arụ ọrụ kapinta, ma jiri obi ya dum hụ Ya n'anya. Josef nwerè nhọrọ ịhapụ Meri ka o zụlite Jizọs naanị ya. Ma kama ime ihe ndị gbara ya gburugburu tụrụ ya anya ime, o merè ihe Chineke chọrọ ka o mee. N'ihi ya, Josef nwerè ihe ùgwù kwa ùgwù nke ịbụ papa Jizọs.
Ihe Omume Nke Ezinụlọ: Mee nụ̀ ihe egwuregwu nke nguzosi ike n'ihe ziri ezi. Were mpempe akwụkwọ abụọ. Dee "Ee" n'otu mpempe na "Mbà" na nke ọzọ. Jìrí eriri kee ime ụlọ unu ụzọ abụọ, tinye mpempe akwụkwọ "Ee" n'otu akụkụ na mpempe akwụkwọ "Mbà" n'akụkụ nke ọzọ. Onye ọ bụla n'ime unu gà n'ewete ọnọdụ na njụ-ajụjụ gasị gà-anwa nguzosi ike unu niile. Iji maa atụ, unu nwerè ike ịkekọrịta ọnọdụ na ihe njụ a: Connor mebiri akwụkwọ-ndetu nwanne ya nwaanyị n'amaghị ama. Mgbe ọ jụrụ ya banyere ya, ya ekwuo na ọ dịghị mgbe o ji yabụ akwụkwọ-ndetu gwuo egwú. Gwa ụmụ gị ka ha gafee ebe akụkụ mpempe akwụkwọ "Ee" nọ ma ọ bụrụ na ha chè na Connor na-akpa àgwà nke nguzosi ike n'ihe ziri ezi, na gafee na akụkụ nke mpempe akwụkwọ "Mbà" ma ọ bụrụ na ha chè na Connor adịghị akpa àgwà nke nguzosi ike n'ihe ziri ezi. Jụọ ha, "Gịnị ka Chineke gà-achọ ka unu mee?" Mee ụdị egwuregwu kwesịrị afọ gasị ndị gị na ha nọ n'ụlọ.
Ajụjụ Mkparịta-Ụka Gasị Maka Ezinụlọ:
• Kpọọ aha otu onye ị ma na-emekarị ihe Chineke chọrọ ka o mee ọbụna mgbe ọ n'atụghị anya ụdị ihe ahụ.
• Kọwaa onye ahụ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!
More