Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Living Changed: Embracing Identity

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

Izerè Ọnyà Ntụnyere

Ị nà-echè ihe ndị dị ka, "Ọ bụrụ na m dị gịrịgịrị, mgbe ahụ a ga m enwe di," ma ọ bụ "Ọ bụrụ na m ma ihe dị ka ya, agara m enweta nkwalite ahụ," ma ọ bụ "Gịnị kpatara na ụmụ m anaghị-akpa àgwà ka ụmụ ya?" Ọ bụrụ na ọ dịtụla mgbe ị na-enwe mmetụta nke nkụda mmụọ n'ihi na ị dịghị ka ndị ọzọ, mgbe ahụ ọ ga-abụ na ọnyà ntụnyere ejidela gị.

Mgbe m na-etolite, ụmụ nwoke na-eji m atụnyere nwanne m nwanyị. Ha na-asi na ahụ amaka m, mana nwanne m nwaanyị bụ "nwa agbọghọ dị ọkụ.” Ịnụ okwu a na-adị m ka esi n'okpuru m kwopụ ụkwụ m. Achọsiri m ike ka a nabata m, ma kama nke ahụ, ọjụjụ ajuru m na-ewute m mgbe niile. Amaara m na ọ bụrụgodị na m erie obere nri, ma ọ bụ gbanwee ka ntutu isi m si acha, ma ọ bụ n'eyi uwe mara mma dabara adaba, enweghị m ike ịdị ka ya ma agaghị m ezu okè.

Mgbe ogologo oge gara na ndụ m, ka m guzorò na-ele Ugwu-nkume a na-akpọ Rocky Mountains, otú ha si maa mma na dị ebube ile anya. N'oge ahụ, Chineke gwara m n'obi m na Ọ bụ Ya kerè Ugwu ndị ahụnamu. Ọ takinyerè m na-agwa m okwu na-asị, "Ị mara mma ọbụna karịa Ugwu ndị a." Ọ na-esiri m ike ịnakwere echiche ahụ bụ́ na otu Onye Okike ahụ nke mere Ugwu ndị a dị ahụkebe, jikọtara m ọnụ n'ime afọ nne m ma nye m oyiyi na ọdịdị ndị m n'akatọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri, ọ bụrụ na Ọ sị na m mara mma, ọ dị mkpa ka m malite kwerewe ha.

Ọtụtụ n'ime anyị agwawo onwe anyị na anyị ezughị okè. N'agbanyeghị ihe ọ bụ anyị n'achọ ịbụ, —ọ bụ̀ ịdị gịrịgịrị, inwe ahụike, ịdị ike, inwe akọ, ịbụ onye n'akpa ọchị —ihe ndị a apụghị ime ka anyị zuo okè. N'ezie, anyị na-atụnyere naanị ihe anyị nwere ike ịhụ anya, n'ihi na mgbe ụfọdụ ihe yiri ndụ dị mfe, na-egbu mgbu ma elee ya anya nke ọma. Anyị nwere ike iji onwe anyị n'atụnyere onye nha efe ya bụ isii mgbe anyị n'amaghị na ọnye ahụ nwere nsogbu iri nri. Anyị nwere ike iche na nwanyị na-arụ ọrụ oyibo dị ike na nwee ezigbo ihe ịga nke ọma na ndụ ya ma anyị amaghị na ezinụlọ ya na-ada ada. Anyị nwere ike n'achọ ka ezinụlọ anyị dị ka nke ndị anyị n'ele anya na ezinụlọ ha zuru okè wee ghara ịghọta na ha na-arịa ọrịa nkụda mmụọ. Eziokwu bụ na ọ dịghị onye n'ime anyị zuru okè.

Anyị ga-akwụsị iji onwe anyị atụnyere onye ọbụla. Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka anyị niile yie onwe anyị, Ọ gara akpụpụta mmadụ niile n'otu ụdị. Kama, O merè ka anyị niile pụọ iche. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mara nke a n'ihi na echiche anyị banyere onwe anyị na-akpụzi ka anyị na ndị ọzọ ga-esi emekọrịta ihe. Ọ na-emetụta mkpebi anyị na-eme. Ọ na-eduzi ndụ anyị. Mgbe anyị ji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, anyị na-efunahụ udo, ọṅụ, na obi ike Chineke nyerè anyị.Ya merè, mgbe anyị n'eme ka echiche anyị hubere Kraịst isi, ma mee ka obi anyị wunye n'usoro dịka ihe Chineke dere n'Akwukwo Nsọ, anyị na-achọta ụzọ Ya maka ndụ anyị. Ndụ Ọ chọrọ ka anyị nwee bụ ndụ jụrụ eju.

Mee Nke A:

Ọ bụrụ na ọ dịbeghị mgbe ị kwupụtarà na e merè gị n'egwù na ịma mma, malite ugbu a kwuwe ya. Ọ bụrụ na ị chefuola ibi ndụ kwa ụbọchị n'eziokwu ahụ, malite ọzọ. Wepu echiche ọjọọ ọbụla nke "Erughị m eru maka ihe a," "A sị na m dị ka ya," ma ọ bụ "A sị na Chineke nyerè m nke ahụ," ma mechie ụzọ ha. Ị bụ̀ ihe okike mara mma pụrụ iche, ihe okike nke Chineke merè, Ọ dịghịkwa emejọ ihe. Ekerè gị n’onyinyo Ya. Ị dị oké ọnụ ahịa. Họrọ ikwere nke a.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Embracing Identity

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com