Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Ịgbanwe Mkparịta-Ụka Ime Onwe Anyị
Mgbe a gwarà gị ka ị kọwaa onye i bù, gịnị na-abata gị n'uche?
Mkparịta-ụka nke ime onwe m abụghị ihe na-egosipụta mgbe niile ezi nwaanyị ahụ Chineke merè m ka m bụrụ. N'enweghị enyemaka Chineke n'ịgbanwe mkparịta-ụka nke ime m, azịza m nwerè ike ịbụ ihe dị ka nke a na nkenke: "Abụ m nne dị afọ iri anọ na ise nwere ụmụaka abụọ. Adịghịzi m galágalá dị ka m dịbù, enwere m isi awọ na akara afọ gasị n'ihu m n'egosi nke a. Anọrọla m na di ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri abụọ na ise, n'agbanyeghị na olu m dị ike n'iba mba. Dika dọkịta m si kwuo, ibù m dị ukwuu. Enweghị m ike iku ume mgbe m na-agba ọsọ, ihe na-amasị m bụ swiitị na potato chip gasị karịa akwụkwọ nri. Abụ m pastọ na ụlọ ụka m, ma erughị m eru ma nwekwaa ọtụtụ ihe na ndụ m n’oge gara aga nke n'eme ka m ghara inwe ike ịrụ ọrụ nke ọma.”
Ọ bụ ezie na nzaghachi ahụ nwere ike ikowa ọnọdụ alụmdi na nwunye m, ibù m, ndabara okike m, afọ m, ọrụ m, na ụfọdụ ụgha nke ụwa na-agwa m, ọ naghị akọwa onye m bụ n'ezie. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n'ime ihe ndị ahụ bụ eziokwu banyere m, mana ha abụghị ihe dị mkpa n'ezie. Ha bụ naanị ọnọdụ gasị, ha abụghị onye m bụ n'ezie.
Nke bụ eziokwu bụ na nke mbụ, abụ m nwa Chineke. Eji ọmarịcha ebumnobi mee m maka ọrụ naanị m pụrụ ịrụ n'ụwa a. Abụ m ọmarịcha ihe osise, nke Onye Okike nke eluigwe na ụwa jikọtara nke ọma. Amaara m nke ahụ ugbu a, mana mgbanwe nke a, site na nzaghachi nke mbụ gaa na nzaghachi nke abụọ emeghị n'otu abalị.
Mgbe mbụ, mgbe m nụrụ ọkpụkpọ-òkù Chineke ije ozi n'ebe ụmụ nwanyị nọ, n'ime onwe m, ọ dị m ka m erughị eru, na m amaghị mma maka ọkwá ahụ. Iguzo n’elu ikpo-okwu na-agwa ụmụ nwanyị na e merè ha nke ọma n’onyinyo Chineke sịịrị m ezigbo ike mgbe m n'echeghị na ọ bụ eziokwu banyere m. Arịọrọ m Chineke ka O nyere m aka ịhụ ihe Ọ na-ahụ mgbe Ọ na-ele m anya, etinyekwarà m ntụkwasị obi n'ikike Ya ịgbanwe echiche m.
Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ebe m nọ n'eme omume nke nyefè na ntụkwasị obi na Chineke, e bidoro m hutawa onwe m ka onye mara mma. Anaghịzi m adabere na ihe na-egosipụta na enyo ma m kwụrụ n'ihu ya. Akwụ m chịm ugbu a na udo dị n'ime m na nnabata na Chineke adịghị ekejọ ihe. O zuru oké na O kerè m wee kpọọkwa m mma.
Ịnabata onye Chineke sịrị na anyị bụ na-enye anyị ezigbote obi ike. Ịmara na Chineke dị mma na ikwere na O kerè anyị dịka ebumnobi Ya si dị, n'enye anyị ndụ. Mgbe anyị ghọtarà na Ọ hụrụ anyị n'anya, dịka anyị dị, ọ ga-ekwe omume ka anyị hụ onwe anyị n'anya nke ọma. Ịgbanwe mkparịta-ụka nke ime anyị abụghị ihe n'eme ngwa ngwa, anyị enweghịkwa ike ime ya n'onwe anyị. Anyị ga-arịọ Ya maka enyemaka.
Nzọụkwụ Omume:
Ọ bụrụ na ị na enwe ndoga maka onye i bụ n'ezie, rịọ Chineke ka O gosi gị otú O si ahụ gị. Rịọ Ya ka O nyere gị aka ịmata ụgha ndị ị kwenyerè gbasara onwe gị wee malite iji eziokwu Ya dochie ụgha ndị ahụ. Ọ ga-anọnyere gị ogologo oge ọ na-ewe, oge na oge ọzọ, ruo mgbe ị kwenyerè na ị tozuru oke, na ị mara mma, na ị dị ike, na ịbụ onye a pụrụ ịhụ n'anya. N'agbanyeghị ogologo oge ị na-eso Jizọs, ọ bụrụ na okwu onwe gị abụghị ihe O na-ekwu banyere gị, ya bụ́ na ọrụ dị nke ị ga-arụ. Tinye ume ma rịọ Chineke ka O nyere gị aka ịnakwere onye i bụ n'ezie n'ime Kraịst.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.
More