Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Living Changed: Embracing Identity

ỤBỌCHỊ 5 NKE 6

Ikike Nke Dị Irè Na Ndụ Anyị

Mgbe anyị ka bụ nwata, ndị mụrụ anyị nwerè ikike ma ọ bụ ike imere anyị mkpebi. Ọbụna ka anyị na-etolite ma na-enwere onwe anyị, anyị kà gà-agbaso iwu na ụkpụrụ gasị emeberè. Enwerè atụmanya gasị anyị gà-edebe n'ụlọ ọrụ, ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, nakwa n'omenala anyị. Ihe dị iche iche dị̀ n'ime nkwudo anyị, mana mgbe e mesịrị, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịhọrọ onye nwere ikike na ndụ anyị.

Mgbe m dị obere, ana m echeta papa m n'ekwu na m bụ onye nwere “ọkpụkpụ buru ibu.” O kwughị ya ka o mejọọ m, amakwaarà m na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu. Mana otù ọ dị, nke ahụ emeghị ka okwu ahụ ghara ifu m ufu n'obi. Ejigiderè m ya n'obi m wee hapụ ya ka o fuo ume n'uche m ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ihe na-echetara m mgbe niile na enweghị m ike ịdị obere, na enwekataghị m zuo okè.

O nwere ike, dị ka m, ihe otu onye n'ezinụlọ gị kwuru na mberede nyerè gị ọnyá n'obi. Eleghị anya, nne gị gwarà gị na ihe niile gbasara gị siri ike, ma ọ bụ na nwanne gị nwanyị achọghị ka ịbịa ya nso. Ikekwe ya abụrụ na otuto na nkwanye-ùgwù si n'aka onye isi ụlọ ọrụ gị dị gị oké mkpa, nke mere na agụụ ya ekweghị ịhapụ gị aka. O nwere ike, ị na-ekwe ka ndị mgbasa-ozi-ọha na-agwa gị ma ị zuru okè ma ọ bụ n'izughị okè. Kedụ onye ị na-ekwe ka ọ bụrụ ikike n'ịgwa gị onye ị bụ̀ na onye ị kwesịrị ịbụ? Chineke na Okwu Ya kwesịrị ịbụ ikike kachasị ike niile n'ekwu okwu na ndụ gị.

N'akwụkwọ Matiu, anyị gụrụ banyere okwu e kwuru n'etiti Jizọs na Ekwensu. Ekwensu bịara ka ọ nwalee Jizọs site n'ịwakpo Onye Ọ Bụ̀ n'ezie. Ọ sịrị Jizọs: “Ọ bụrụ na Ị Bụ̀ Ọkpara Chineke." Nzaghachi Jizọs tọrọ m ụtọ nke ukwuu! O bidoghị kwuchitewere Onwe Ya ma ọ bụ n'agbalị ịrụ ụka. Ọ Onye Ya Onwe Ya Bụ̀: Ọkpara Chineke, Onye Nketa nke Ocheeze Eluigwe, Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ! Rịba ama otú ekwensu si jụọ onye Jizọs bụ̀ ugboro abụọ tupu ọ hapụ ajụjụ ahụ banye n'ọzọ. Nke ahụ bụ n’ihi na ekwensu enweghị echiche okike. Ọ na-abịakwute anyị site n'otu mwakpo ụgha ọ n'agwa anyị mgbe nile, wee na-achọkwa ebe adịghị ike n'ime ngwa-agha anyị. Ya merè anyị gà-eji nọrọ na nche, na-adị ka Jizọs, na-alụ ọgụ megide onye iro ahụ jiri ngwa-agha anyị kachasị sie ike.

A kọwara Akwụkwọ Nsọ dịka Mma-agha Nke Mmụọ Nsọ. Mgbe anyị na-eji Ya egbutu ụgha ndị na-efega n'ebe anyị nọ, anyị na-enye ikike Chineke nkwubi okwu banyere onye anyị bụ̀ n'ezie ma n'eme ka atụmatụ ndị iro ghara ịdị ike. Anyị ekwesịghị igbakwasi onye anyị bụ̀ n'ezie n'ọrụ anyị, n'oge anyị gara aga, n'ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, n'ụmụ anyị, n'ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere anyị, ma ọ bụ ọbụna ozi anyị n'ejere ụlọ ụka anyị. Azịza nye onye anyị bụ̀ n'ezie esighị n'obodo anyị, ndị nkatọ anyị, ma ọ bụ omenala anyị. Naanị Chineke kwesịrị inwe ikike n’ihe anyị kweerè gbasara onwe anyị. Onye anyị bụ̀ n'ezie dị irè na dabere naanị na Ya. 

Mee Nke A:

Wèré ihe atụ gị n’aka Jizọs. Ka nzaghachi Ya nye mwakpọ ekwensu bụrụ atụmatụ agha gị. Enyela onye iro mgbado site n'ikwe ka o mee ka ị nwee obi abụọ banyere onye e kerè gị ịbụ́. Mụta ka esi eji Mma Agha Nke Mmụọ Nsọ megide ụgha nke ndị iro, atụmanya n'ezighị ezi nke ụwa anyị, na okwu onwe gị na-adịghị mma. Ị bụ̀ onye ahụrụ n’anya, onye tozuru okè, onye ana apụghị itufu, na onye Nna anyị bi n’elu-igwe hụkwara n’anya. N'ekwupụta eziokwu ndị a ugboro ugboro ruo mgbe ha nọchirì anya aghụghọ ọ bụla i kwerè ka ọ nọrọ n'ime obi gị. Onye ị bụ̀ bụ nwa Ya nke Ọ hụrụ n'ezigbote anya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Embracing Identity

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com