Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Living Changed: Embracing Identity

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

Aha Gasị N'ata Anyị Ahụhụ

Ọ dịghị onye ọ na-amasị ka akpọọ ya ihe ọ na-abụghị. Nke a bụ n'ihi na aha ndị ahụ adịghị enye nkọwa kpọmkwem gbasara onye ahụ, ha dị mgbochi, ha abụghịkwa eziokwu. Ha ji echiche dị iche iche abịa, ndị nwere ike ịdị njọ, wee n'achakwa ọkụ nà àgwà anyị kachasị dị njọ na mmejọ anyị kachasị dị ukwuu. Aha ọjọọ anaghị ahapụ ohere maka ndịiche, ito eto, ma ọ bụ mgbapụta. Ebe ndị mmadụ pụrụ ịnyanyè anyị aha otú o si masi ha, anyị nwerè ikike ịhọrọ ịghara ibi ndụ n'okpuru aha ndị ahụ.

N'oge m ka bụ ezigbote nwa agbọghọbịa, a kpọrọ m onye okwa iko. Ahụrụ m ọmarịcha ahụ m n'anya nke ukwuu ya ewee na atọbi m isi na ụmụ nwoke n'eso m ka ijiji. Emerè m ọtụtụ mkpebi ọjọọ dị iche iche n'ihi na ahụghị m onwe m dị ka onye kwesịrị ka a hụ ya n'anya. E birì m oké ndụ ọjọọ nke na ọ dịịrị m ezigbo mma mụ na nwoke imeko ka o wee kpọọ m nwaanyị mara mma ma ọ bụ onye ahụ ya amaka, nwa oge ahụ, ebe ihe m kwesịrị ime bụ ịrịọ Jizọs ka Ọ gwọọ m na mee m ka m zuo okè.

A nọgidere m n'igba ngba nke ịghọta na m bụ mmadụ tozurù ezi ịhụnanya ọbụna mgbe m maliterè iso Jizọs. Mgbe m mụrụ nwa ọhụrụ, enwere m nchegbu na m bụ naanị onye buru ibu n'enweghị ihe ọ bụla bara uru inye ụwa a n'ihi na agụchaghị m mahadum. Ozizi Oziọma na kwà ngwụcha-izu-ụka nyerè m ezigbo agbamume, mana o siirì m ike iwebata eziokwu Chineke ná ndụ m kwa ụbọchị. N'ileghachi anya azụ, enwere m ekele nke ukwuu na Chineke ahapụghị m. Ọ nọgidere na-enye m ohere ime ihe maka Alaeze Ya, ọbụna mgbe m na-echeghị na m pụrụ ime ya.

Anyị nile nwerè aha ọjọọ gasị tapara anyị na-ahụ, ndị anyị nakwerelà n'onu ndị mmadụ, na ndị anyị ji aka anyị yinye n'ahụ anyị. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ekwe ka aha ndị ahụ n'egbochi anyị ma na-agwa anyị na anyị sọọsọ ezughị oke. Sọọsọ. Anyị na-agbakwunye okwu a dị obere ma dị oké mkpa mgbe anyị na-akọwa onwe anyị, wee n'ekwe ka aha ndị ahụ gupu anyị na abam uru nke onwe anyị. O nwere ike ịbụ na ị nụla ọtụtụ mmadụ na-ekwu ya, ikekwe ịkwuola ya n'onwe gị. "Abụ m sọọsọ nwa akwụkwọ sekọndrị" ma ọ bụ "Abụ m sọọsọ onye nri ahụ." 

Nke bụ eziokwu bụ na ị bụghị ihe afọ gị, ọnọdụ ọrụ gị, akwụkwọ ụlọ ọgwụ gị, ọnọdụ alụmdi na nwunye gị, mgba gị, ma ọ bụ ihe gara aga na ndụ gị n'ekwu. Aha ndị ahụ nwere ike ịbụ nkọwa nke ọnọdụ gị, oge gị ugbu a, ma ọ bụ nnwale gị, mana onye ị bụ n'ezie bụ̀ onye Chineke kwuru na ị bụ, ọ dịghị ihe ewepụrụ ma ọ bụ tinye na nke a.

Ị mara mma, Ị dị ike, Ị ruru eru. Emewo ka i dị ọhụrụ n'ime Kraịst. È nyeghị gị mmụọ nke egwù, kama nke ịhụnanya, na ike, na uche zuru okè. Ị bụ karịa onye mmeri n'ime Kraịst Onye na-enye gị ike. Eji mkpacha anya kee gị maka ebumnobi naanị gị pụrụ imezu n'elu ụwa a. Ahụrụ gị n'anya. A họpụtara gị. Ị tozuru okè.

Mee Nke A:

Chee echiche banyere aha ndị ị na-eyi megidere ihe Chineke na-ekwu banyere gị n'Akwukwo Nsọ. Kedụ akụkụ gasị nke ndụ gị na-eme gị ihere? Kedụ ihe ukwu ndị ahụ n'echu gị ụra n'abalị? Kedụ ihe si n'oge gara aga ị na-agbalị izobe n'ihi na ị na-atụ egwù mmadụ ịchọpụta ya? Rịọ Chineke ka O gosi gị akpọm-aha gasị na-anyịgbu gị na ka O nyere gị aka ikwekọ onye i bụ̀ n'ezie na eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Embracing Identity

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com