Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Ịhọrọ Ịbụ Akụkụ Nke Atụmatụ Ya
Mgbe anyị kwenyerè na àkara ndị e kenyerè anyị ma ọ bụ kwenye na anyị erughị eru, anyị na-efunahụ ndụ mara mma nke Chineke chọrọ maka anyị. O kerè onye ọ bụla n'ime anyị wee nye anyị ngwakọta pụrụ iche nke àgwà, ike na nkà, Ya ewee na-atụ anya na anyị ga-ahọrọ iji ha mee ihe maka Alaeze Ya. Mgbe anyị lekwasịrị anya nke ukwuu ná enweghị ntụkwasị obi anyị, echiche na mmetụta ndị ahụ na-adịghị mma nwerè ike ịdọpụ anyị ngwa ngwa n'ebumnobi Ya maka anyị.
Ọtụtụ afọ gara aga, anụrụ m banyere ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ nke ụmụ nwanyị, m wee chọọ ịga. Enwere m mmetụta nke onwe m n'adịghị mma nke na ọ fọrọ nke nta ka m ghara ịga. Agwara m onwe m na ha achọghị nne na-anọ n’ụlọ buru ibu bụ́ onye na-enweghị ike iweta ihe ọ bụla bara uru ná mkparịta ụka ahụ n’ihi na ọ machaghị ihe banyere Akwụkwọ Nsọ. N'agbanyeghị egwù m, akwalirì m onwe m wee gaa mkparita-ụka ọmụmụ ahụ. Dị ka ọ na-eme mgbe niile, Chineke ji obere nzọụkwụ nke ntọhapụ ahụ malite mgbanwe n'ime m. O nyeerè m aka ịhụ uru m bara ma mee ka ọdịdị onwe m dịkwuo mma.
Ihe m na-aghọtaghị n’oge ahụ bụ na Chineke nọ na-akpali m ka m tụkwasị Ya obi ka m wee mechaa nyere ụmụ nwanyị ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ. Naanị mgbe m nyeferè Ya enweghị ntụkwasị obi m ka m dị ike wee banye n'ọkpụkpụ. N'ezie, ihe m mụtara n’ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ kpọmkwem ihe m ji mee ihe mgbe m maliterè izi ozi. Ọ bụrụ na m kwerè ka ụjọ m mee ka m ghara ịga n’ụbọchị ahụ, ndụ m na ozi m gaarà-adị nnọọ iche. Ikekwe ọbụna ebighị ebi ga-adị iche nye m.
Ịmara ndị anyị bụ̀ na Kraịst na-enye anyị obi ike sitere na Chineke. Ọ bụghị n'ihi na ewepụrụ ezughị okè anyị ná-akpatá enweghị ntụkwasị obi anyị, kama ọ bụ n'ihi na anyị ghọtara na adịghị ike anyị na-eme ka ike Chineke zuo okè n'ime anyị. N’ezie, ntụpọ anyị apụghị igbochi Chineke iji anyị wee rụọ ọrụ. Ọ bụ ọkachamara n'iji ndị na-eche na ha erughị eru, ma ọ bụ na ha ezughị oke, ma ọ bụ na ha enweghị ike, mee ihe na rụọ ọrụ. N’ime Akwụkwọ Nsọ niile, Ọ na-arụ ọrụ site n’aka ndị na-ezughị okè sitere n’agbụrụ, n'okike, n'afọ dị iche iche iji mezuo uche Ya. Ọ dịghị ihe na-eme ka anyị ghara iru eru n'anya Ya. Naanị anyị pụrụ iwepụ onwe anyị na atụmatụ ọma Ya maka anyị. Anyị gà-ahọrọ ikwe ka Chineke kwuo na gwa anyị ndị anyị bụ̀ n'ezie na ịbụ akụkụ nke atụmatụ Ya, ma ọ bụ anyị ahọrọ ikwe ka ndị ọzọ kpọọ anyị aha ọjọọ wee funahụ ohere imetụta ebighị-ebi gasị aka ọma.
Mee Nke A:
Chee echiche nwa oge, otú ụgha ndị ị kwenyerè banyere onwe gị nwere ike isi n'eme ka ị ghara ịnụ ntụziaka Chineke maka ndụ gị. Ị̀ nà-ege ntị karịa n'echiche na atụmanya nke ndị gbara gị gburugburu, ma ọ bụ̀ ị̀ kwekọsirì ike n'ihe Chineke na-agwa gị n'ime obi gị? Ekwela ka nzube Chineke maka ndụ gị fuo n'ihi na i ji ihe ọzọ mee mgbakwasị maka onye ịbụ. Rịọ Chineke ka O wepụ ụgha ndị e liri n’ime obi gị. Ya wughachi ihe etipịarà. Ma rịọ Ya ka O gosi gị otú ị ga-esi nye aka n'etolite Alaeze Ya. Ị nwerè ọnọdụ pụrụ iche n’ime obi Ya na ọrụ dị mkpa n’atụmatụ Ya.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.
More