Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀Ihe Nhụchatụ

Living Changed: Embracing Identity

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

Nnabata Onye Ị Bụ̀ N'ime Kraịst

 Enwere ihe dị iche ima ihe ederè n'ime Akwụkwọ Nsọ na inwe nkwenye dị omimi nke n'eweta ngbanwe n'otú anyị si ebi ndụ anyị. Inakwere onye anyị bụ n'ezie n'ime Kraịst, bụ̀ ihe na-enye anyị ike iji obi ike chee ọnwụnwa ihu. Ọ na-eme ka ndụ anyị nwee ọṅụ, udo, na nzube. Ọ na-enye anyị ohere ịhụ onwe anyị n’anya n’ihi na hụrụ anyị n’anya. Ịghọta onye anyị bụ̀ na Onye anyị bụ̀ nkè Ya na-agbanwe ihe niile, mana anyị gà-anọrírí na nche mgbe niile.

Site na mgbe anyị maliterè ikwere na anyị tozuru okè, na Ọ huru anyị n'anya, na Ọ kewapụtarà anyị, onye iro ahụ na-anwa ike ya iwepụ nkwenye anyị n'ihe ndị a. Ọ na-akpọ anyị asị mgbe anyị deberè ezi onye anyị bụ̀ n'ime Jizọs n'ihi na ọ na-eme ka ọ ghara inwe ike ná ndụ anyị bụrụkwa ihe na-akpata mmetụta dị nro nke na-agbasa olileanya nye ndị ọzọ. Anyị agaghi ekwe ka ekwensu chetara anyị ihe ndị anyị merè n’oge gara aga ma ọ bụ mee ka anyị kwenye na anyị apụghị ịgbanwe. Akwụkwọ Nsọ kwuru na mgbe anyị nabatarà Jizọs n’ime obi anyị, anyị bụ ihe e kerè ọhụrụ. Amara Ya na-ekpuchi mmehie anyị, ihere anyị na ihe gara aga anyị. Anyị gà-ejisi eziokwu ahụ ike bụ́ na anyị bụ̀ nke Ya.

Ọ na-echetara m maka otu osisi dị n’ogige anyị. Mgbe mbụ a kụrụ ya, osisi ahụ chọrọ ihe nkwado iji jide ya ma nye ya ike. Ka oge na-aga, osisi ahụ tolitere gburugburu ihe nkwado ahu, na-eme ka iwepu ígwè ahụ bụrụ ihe siri ike. Ugbu a, ihe nkwado ahụ aburugo akụkụ nke osisi ahụ. N'otu aka ahụ, eziokwu Chineke na-ewusi anyị ike. Ọ bụrụ na anyị ejidesie ya ike ruo ogologo oge, n'ikpeazụ ọ ga-aghọ akụkụ nke ezi onye anyị bụ̀ nke ana apụghị iwepụ ewepu.

Nzọụkwụ Omume:

Chineke wepụtara oge, jiri nlezianya kee obere akụkụ ọ bụla na-eme ka ị bụrụ onye ị bụ̀. Ọ na-ahụ gị ka i dị n'ezie wee n'ahụ gị n'anya enweghị ọnọdụ iwu ọbụla. Ka eziokwu ahụ banye n'ime gị. Agbapụlà ọsọ n'ebe eziokwu ahụ nọ, ezola onwe gị ka ọ ghara irute gị nso, ma ọ bụ mee ka ịchụpụ ya. Rịọ Chineke ka O nyere gị aka ikwere ya ma mee ka ọ bụrụ akụkụ nke gị n'enweghị ike ikewapụ̀. Mgbe ị nabatarà onye i bụ n'ezie n'ime Kraịst, ị ga-enweta nnwere onwe pụọ n'ụgha ndị na-ejide gị ma nwekwa obi ike na-eche ọnwụnwa ọbụla ihu.

Chineke Nna, daalụ maka iduzi m ka m wee gụọ atụmatụ ihe ọgụgụ a na inyere m aka ibido njem iji gbakwasị ezi onye m bụ̀ n'ime Gị. Biko nyere m aka ịhụ àkara ugha ndị m na-ebi n'okpuru ha ma nyere m aka ijiri eziokwu Gị dochie ha. Nyere m aka ịkwụsị iji onwe m atụnyere ndị ọzọ na ikwe ka okwu onwe m na-adịghị mma na-akpụzi ọdịdị onwe m. Nye m anya ka m hụ onwe m dị ka Ị sị na-ahụ m, onye a hụrụ n'anya, onye mara mma, onye nwere ike, onye nwere onyinye pụrụ iche, na onye ekezirì ofuma. Achọrọ m ka naanị onye Ị si na m bụ dị irè na ndụ m. Ana m enye eziokwu Gị ikike na ndụ m wee n'arịọ Gị ka Ị gosi m otu m ga-esi jiri ihe Ị nyere m mee ka Alaeze Gị too. Daalụ maka ịhụnanya Gị n'enweghị atụ nke n'ahapụghị m, rapara n'ebe m nọ ma dọta m nso Gị. Ahụrụ m Gị n'anya ma tụkwasị Gị obi. N’aha Jizọs Dị Ebube, amen.

Anyị na-ekpe ekpere ka Chineke jiri atụmatụ ihe ọgụgụ a jee ozi n’obi gị.

Chọpụta Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ dị ka Ibi Ndụ Ngbanwe

Mụtakwuo maka Changed Women's Ministries

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Embracing Identity

N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com