Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Udo
“Iwu Gasị” Ndị Farisii nọ̀ na-arụtụ aka na Mak 2:27 gụnyerè ògigè na ngígá Ndị Hibru kwadeberè ọgbọ gasị gara aga.
Nke na-ebute anyị nà nzaghachi Jizọs banyere okike Ụbọchị Izu Ike maka ọdịmma anyị, kama anyị ịbụ ndị aga eji Ụbọchị Izu Ike na-akpagbu. Ka O si ahụta ya, n'ezie, bụ otù a: Mozis na ndị amụma kwadeberè usoro-omume-ihe nke Ụbọchị Izu Ike, mana Mụ—Jizọs—bịara igosipụta na nye ìhè na ezi mmụọ eji nye yabụ iwu. Ma mmụọ nke ya bụ́ nke udo, ọ bụghị nke mmachibido.
Nghọta ngwá bịara m n'uche ka m nọ n'elu àkwà otu ehihie bụ na e nwerè m ike ịbụ onye kasị nwee ihe ọ kwadeberè ịrụ, kasị rụọ ọrụ n'oge nke n'eme ka ihe na-aga nke ọma, na bụrụ onye na-adịghị atụ egwù ịrụ ọrụ n'ụwa niile mana ọ bụrụ na m efunahụ mmụọ nke Ụbọchị Izu Ike, ana m efunahụ ebube Chineke kwadeberè maka yabụ ụbọchị.
N'ụwa a, e kwerè anyị nkwa na anyị gà-anata na gabiga nwa ntakasị-ahụ na ọgbaghara. Maka ụfọdụ n'ime anyị, e kwerè anyị nkwa ọtụtụ ihe. “N'ime ụwa a na-amaghị Chineke unu gà-aga n'ihu n'enwe ahụmahụ ihe isi ike na nsogbu,” ka Jizọs kwuru na Jọn 16:33. “Mana sie nụ̀ obi! Emeriwo M ụwa.” Ma n'ụzọ n'atụ anya, ụzọ Jizọs si emeri ụwa abụghị site na omume gasị ibu agha kama site n'omume nke udo ná-amibànyé ma n'amikpú. Ọ bụ̀ udo nà-akpọrọ anyị bịa ebe Jizọs nọ. Ọ bụ udo nà-azọpụta mkpụrụ obi anyị. Ma ọ bụkwa udo nà-azọpụta izu anyị gasị n'aka mgberede, udo nke ụbọchị anyị n'ezu ike. Chineke maarà na izu ike gà-adị anyị mkpa otu ụbọchị n'izu, dị nnọọ ka anyị gà-achọ irapara na àkwà anyị ka anyị gbaghàricharà n'okporo ụzọ n'izu. Ọ mà na anyị gà-achọ ebe dị mfe idinà, ihe mgbasa-ụkwụ na nwété-onwe anyị gà-achọ iji wee weghachi mkpụrụ obi anyị n'ọnọdụ dị mma. Ya merè, ejìrì mee Ụbọchị Izu Ike—ọkpụkpọ-òkù, onyinye, ihe ndetú-ire n'elu nke udo.
N'omenala Ndị Juu, e nwerè aha ana akpọ nke a: “Shabbat shalom”— pụ́tará, “kà ụbọchị gị ịna agaghị arụ ọrụ bụrụ gị nke udo.” Otu onye gà-eji okwu a kelee mmadụ ibe ya, ma onye ahụ gà-azaghachi si: “Kà ụbọchị gị ịna agaghị arụ ọrụ bụrụkwa gị nke udo.”
N'ihi na Chineke abụghị naanị Onye n'eke udo kama Ọ bụkwa Udo n'Onwe Ya, ụzọ ọzọ aga esi kwuo okwu ekele ahụ bụ̀, “Kà Chineke dịrị n'ime izu ike gị, ka ị dịrịkwa n'ime izu ike Chineke.” Ụbọchị izu ike bụ̀ ụbọchị iji mata udo, iji nwee ahụmahụ na gosipụta udo nke Chineke.
Ịgụ atụmatụ ihe ọgụgụ a ọ̀ tọrọ̀ gị ụ̀tọ́? Ọ bụrụ otù ahụ, debanye aha gị ka irite akwụkwọ ya dum ebe a
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More