Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Njikwa Etú Anyị Chọrọ Ka Esi Na-ahụta Anyị
"Arụmọrụ na anọghị ofu ebe nà-eje ozi dị ka ụdị mmesi-obi-ike nke ịdị adị, mgbochi megide abaghị uru," otu onye edemede (Tim Kreider) derè. "O doro anya na ndụ gị enweghị ike ịbụ nke nzuzu ma ọ bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ị na-arụsi ọrụ ike, ịnweghị ohere ma ọlị ịnọ nkịtị, na gị abụrụ onye a n'achọ kwa awa nke ụbọchị n'ihi nkà gị ma ọ bụ ihe dị uru n'ime gị."
Anyị nà-azụta ụlọ karịa ka anyị ji ha eme ihe, anyị nà-ebuli akụkọ ezumike anyị garà n'ọkwa dị ogo karịa, anyị nà-eji nganga ná-agụpụtá usoro ihe omume anyị juru eju, anyị nà-ajụkwa ikwe ka ndị ọzọ hụ anyị ka anyị n'ezu ike. Oh, ihe ndị anyị na-eme n'aha njikwa etú anyị chọrọ ka esi n'ahụta anyị. Anyị niile chọrọ ịdị mkpa. Anyị niile chọrọ ka obere ndụ anyị bụrụ na dị uru. Ma anyị nà-eme ya kpamkpam n'ụzọ na-ezighị ezi. Ngosi onwe na ndebe-ahụ aṅaa na ime ihe niile i pụrụ ime nwerè ike inyere gị aka ịnweta ihe ahụ i nà-achụ, rite ihe ahụ n'agụ gị, ma gị abụrụ onye n'eme ka ihe niile dị sám ka ụbọchị n'abịa na njedebe. Ma abịa n'ihe gbasara ịkwalite ihe nke ezi omume? Ọ pụghị ime ka i rutegodí na nzọụkwụ nke mbụ.
Jizọs kwuru na ịnya isi niile nwerè ike nweterè anyị ihe ụfọdụ, ma ọ gaghị enwetara anyị otu ihe ahụ anyị na-achọ n’ezie, nke bụ ịhụnanya na-ejupụta mkpụrụ obi nke Nna anyị, echiche na ana-anabata anyị dị ka anyị si dị. “Ihe nile nke dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́, ọchịchọ nke anya, na mpako nke ndụ—esighị n’aka Nna anyị, kama ọ bụ site n’ụwa.” (1 Jọn 2:16).
N’Oziọma Matiu, a gwara anyị ka anyị ghara ịdị ka ndị ihu abụọ, bụ́ ndị na-enwe mmasị ikpe ekpere ka ndị mmadụ hụ ha, bụ́ ndị na-enwe mmasị ikwusa ozi ọma ime mmụọ ha na ịdị elu ha, bụ́ ndị hụrụ onwe ha n’anya itinyè onwe ha n’ịgbalị ime ka ndị mmadụ mara ka ha si dị mkpa. Ee, kama nke ahụ, Jizọs na-ekwu na anyị gà-arụ ọrụ n'ime ime anyị, n'etinye ume anyị n'ịzụlite ihe ndị dị ka mmụọ dị nwayọọ, nke, dị ka 1 Pita 3: 4 si kwuo, "bara uru dị ukwuu n'anya Chineke" (NIV).
Mmụọ dị nrọ̀—ihe anyị bụ́ mmadụ na-apụghị ịzụlite n'ike anyị ma ọ bụ ọsịịsọ.
Ka anyị n'ebi ndụ anyị, mụ na ezinụlọ m hiwerè omume nke ịchịkwa etú anyị chọrọ ka esi n'ahụta anyị wee malite ibi ndụ anyị n'ụzọ dị jụụ na ịzụlite mmụọ dị nrọ̀. Otu ugboro n'izu, anyị nà-anọrọ onwe anyị jụụ emeghị ihe ọbụla na enweghị onye ọbụla anyị nà-achọ ime ihe ka ọ huta anyị ka ndị dị uru ma ọ bụ dị mkpa.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More