Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Ndọpụ Uche Gasị
Aga m asị ee na ngwa eletrọnịkị m niile dị ezigbo mma. Ọ bụghị asị ka m nà-asị. Mana nke a bụ̀ ihe m na-amụta n'adịghị mma: inwe mmasị na ihe m karịa n'ebe Chineke nọ.
Nke a abụghị nsogbu n'ihi na ọ bụ m na-ekwu ya, kama ọ bụ n'ihi na Chineke na-ekwu ya na Matiu 11:28.
Mgbe Chineke kwuru na izu ike dị n'ime Ya, ọ pụtara na izu ike n'ezie dị n'ime Ya. Ịtụgharị ya ka o doo anyị anya: Ezi izu ike adịghị ebe ọzọ e wezụga na M. Na nso nso a, anụrụ m otu Pastọ na Maryland na-ekwu maka ọdịiche dị n'etiti ntụrụndụ na izu ike. Anyị nà-emekarị otu karịa ibe ya, ma nke anyị nà-eme nke ọma abụghị izu ike. Dịka ọmụmaatụ: N'afọ gara aga, mụ na ezinụlọ m garà Disney World otu izu dum, mana, mgbe m lọtara, ike ọgwụgwụ m dị ike karịa ka ọ dị m mgbe anyị pụrụ. Màrá nà ezigbo ike gwụrụ m mgbe anyị nà-akwado ịpụ. O nwerè ike ịbụ na agbanàrì m mgbakasị ahụ́ nke ndụ kwa ụbọchị, manà ezuola m ike nwanu m chọrọ? Nke a bụ ihe Chineke na-egosi ebe a, na izu ike dị njikọta na ọnọdụ nke mkpụrụ obi anyị.
Anyị na-ekweta na ụda-obi-dí-mma dị oke mkpa maka ịnọgide n'enwe ezi ahụike. Otití obi n'aga n'ihu enweghị nsogbu, dì mkpa, ọ bụghị ya? Ihe anyị na-eji nwayọọ ná-ekwetá bụ̀ na mkpụrụ obi anyị chọkwarà otití ahụ n'aga n'ihu enweghị nsogbu. Christine Sine derè, sị: “Anyị niile maarà na ọbụrụ na obi anyị adịghị eti nke ọma, ya pụtara na anyị gà-aga hụ onye dọkịta ka o lee anyị ahụ. Otú ọ dị, ihe ká ọtụtụ n'ime anyị amaghị banyere otití-gasị nke ime mmụọ dị oké mkpa maka ahụike na ọdịmma anyị. Ebe ọ bụ na ndụ anyị n'adị ike na-apụ na otití-gasị ụwa nke Chineke, anyị adịghị anụ mmúrùmù okwu nke ụda obi Chineke kwesịrị ijigide na ịkwagide anyị, nke kpatara na anyị adịghị ama ihe ndị ịrịba ama kwesịrị ịdọ anyị aka ná ntị na ahụ adịghị anyị”.
Ya merè na mgbe Chineke sịrị anyị, “Bịakwutenu M, M gà-emekwa ka unu zuru ike,” anyị adịghị azaghachi.
Chineke anwaa ọzọ, sị: “Tụkwasịnụ M ibú unu, ụmụntakịrị M, soro nù M jee ije, ije unu agaghịkwa enwe ibu arọ.” Ọzọ, anyị anaghị azaghachi.
Chineke ewee ka n'ekwu, "Achọrọ M ka mmasị unu dị na M, adịghị n'ihe ọbụla ọzọ." Anyị agbachi Ya nkịtị.
N'ịbụ Onye nwere ndidi ma dị nnọgidesi-ike mgbe nile, Chineke ekwuo ya nke ugboro anọ: "Jìrí nù ya nwaayọ. Lelie anya unu elu. Soro nù M nọrọtú ebe a."
Ọ bụzi mgbe ahụ ka ọ dị anyị ka anyị na-anụ ihe a n'ekwu. Cheregodi. Ihe ahụ ọ̀ bụ̀ olu Chineke? Anyị ewee lelie anya anyị elu wee sị, "Ei? Chineke, ọ̀ bụ̀ Gị?Gịnị bụ "nọrọtú'?"
Ma tupu Ya enwee ohere ịza, anyị na-anụ ka mkpọtụ ozi ọhụrụ n'abata n'ekwentị anyị—nke na-agwa anyị na-ọdị ihe ọhụrụ dị n'ime ya n'echere anyị. Ka ozi ahụ batarà, anyị amara ahụ jijiji pịwa ekwentị anyị kà anyị mara ozi ahụ batara na ya. Nke a n'eme ka Onye Iro nke mkpụrụ obi anyị gunye àgwà anyị a kà mmeri n'akụkụ ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More