Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Usoro Kà Jizọs Si Eme Ihe Dị Mkpakọrịtá
Nye okwu ahụ ana ekwu gbasara iji mara mgbe oge rùrù ka emee mkpakọrịtá na mwezụga, ahụrụ m na Jizọs merè ihe ọzọ nke ọma: O gerè ntị n'olu Nna Ya, ma kwe ka ntámùrùmù okwu ndị ahụ si na Chi Ya duo ndụ Ya.
Nke a, n'ezie, bụ̀ ihe “mwezụga” niile ahụ Jizọs nọ n'eme bụ̀ maka ya. Ọ bụ̀ maka iwepụta oge kpee ekpere, Ya na Nna Ya akpakọrịta, ma Ya adabere ma nọọ jụụ ná-mmákụ̀ nke Nna Ya.
Anọ m ná-anwale ịkọwara otu ezigbo enyi m nke a wee si, “Ọ dị otù a: Kedụ ka ọ gà-adị gị ma Pam na mụ kpọọ gị na di gị òkù ka unu bịa rie oriri abalị n'ụlọ anyị, mana, ozugbo unu bịara, mụ na ya awùnyé na ụgbọala anyị wee nyàrá pụọ gaa ime ihe ndị ọzọ? Gị na di gị akwúrú n'ihu ụlọ anyị ebe anyị hapụrụ unu, ma unu ma ọmarịcha flawa unu wetaarà anyị, n'echè ihe kpatara ndị kpọrọ unu oriri jìrì wee hapụ unu otù ahụ.”
Ma mụ na gị ná-agụ́ ihe a gà-adị mgbagwoju anya ma ụdị ihe a mee anyị, ọbụghị ya? Ọbụrụ na mmadụ kpọrọ gị oriri abalị na be ya, ịga atụ anya na onye ahụ gà-anọ na be ya n'eche gị ka ịbịa. Ịga na-atụ anya nnọkọ mkparịta ụka dị mma nke gị na onye a, ịga na-atụ anya na ọ gaghị akpaso gị àgwà n'ụzọ dị ọsọ ọsọ ma ọ bụ n'iwe, ịga na-atụ anya na uche onye kpọrọ gị oriri ahụ gà-adị na gị na oriri ọ si gị bịa na ya.
Nke a bụ̀ kpọmkwem kà Jizọs si wee kpaso Chineke àgwà. Oge ndị O merè mwezụga, O nwerè izu ike Ya si na Chi, abụghị nnọkọ mmanye Ọ tùsàrà n'ihu Chineke; ha bụ oge O jìrì mkpachara-anya na ịhụnanya chiri-anya bịa ka Ya na Nna Ya nọkọọ na kpakọrịta, oge ndị ọ dịghị ihe ọbụla ọzọ nọchiri Jizọs anya ma ọ bụ dị Ya n'obi. “Ihe i nwerè ịhụnanya maka ya, ihe n'adịgide gị adịgide n'uche, gà-emetụta ihe niile gbasara gị aka,” ka Pedro Arrupe kwuru. “Ọ bụ̀ ya gà-ekpebi ihe gà-eme ka isi na àkwà gị kulie kwa ụtụtụ, ihe i gà-eji mgbèdè gị mee, ihe i gà-eji ngwụcha-izu gị gasị eme, ihe ndị i nà-agụ, ndị i maarà, ihe na-agbawa obi gị, na ihe n'eme ka i jupụta na ọṅụ na ekele. Hụ̀ n'anya, nọgide n'ịhụnanya, ma ọ bụ ya gà-ekpebi ihe niile.”
Jizọs hụrụ Nna Ya n'anya. Ma otu ịhụnanya ahụ dí ukwuu bụ̀ ihe kwaziri ma duzie ihe niile O merè—na ndị Ọ n'emeghị.
Ọ gbatarà m n'uche ka m nọ n'oche ọrụ m n'ụtụtụ a, na ọbụrụ na atụmatụ ihe ndị m chọrọ ime abụghị ihe ndị n'eri m ahụ kama ọ bụ nke mbanye n'ime izu ike nke Chineke, a gaarà m enwe udù kwa udù afọ ojuju na ike nke m gà-esi na ha wee n'eje ozi n'ọñụ nye ndị ahụ n'emebikarị atụmatụ m na ihe ndị m kwadeberè.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More