Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Ka Jizọs Si Eme Ihe Bụ̀ N'usoro
Anyị nà-ahụ ka Jizọs nà ewezụga Onwe Ya ịnọrọ Onwe Ya na chee echiche banyere ozi ọjọọ Ọ natarà, dịka mgbe Ọ nụrụ na enyi Ya Jọn Onye Na-eme Baptizim anwụọla. Ọ nà-ewezụga Onwe Ya inweta nghọta-ime banyere mkpebi gasị dị mkpa, dịka ụdị nwoke ndị O kwesịrị ịkpọ ka ha soro Ya. Ọ nà-ewezụga kwa Onwe Ya ka O kpee ekpere. Ọ nà ewezụga Onwe Ya ka Ya na ndị enyi Ya chiri-anya nwee nnọkọ dị ụtọ. Ọ nà ewezụga Onwe Ya dịka ụzọ isi kụziere ndị umuazú Ya uru n'enweghị okè nke izu ike. Ọ dịghị èché ruo mgbe ozi Ya bịara na njedebe. Ọ dịghị èché ruo mgbe mmadụ nyerè Ya ụbọchị ole na ole ka O zuo ike. Ọ dịghịdị èché ka “Ụbọchị Izu Ike” ekpebirì ruo. Mgbe ọbụla O nwerè mmetụta na oge eruwo ka O wezụga Onwe Ya, Ọ na-apụ ozugbo.
“Jizọs rùberè isi nye usoro omume ihe dị omimi,” ka Wayne Müller derè. N'ụzọ n'adịghị mgbágá, O merè nke ahụ: kpakọrịta, kpakọrịta, mee ihe, wezụga onwe… mee mkpakọrịtá, kpakọrịta, mee ihe, wezụga onwe.
N'usoro n'usoro—ọ bụ̀ otù ahụ ka Jizọs si wee bie ndụ.
Ọ bụkwa otù ahụ ka esi wee n'akpọ anyị òkù ka anyị bie ndụ anyị.
A na-akpọ anyị òkù irusi ọrụ ike ma wezụga onwe anyị kwa mgbe kwa mgbe ma tụkwasị obi na ihe ọbụla merenụ n'oge anyị n'ezu ike ka anyị pụrụ imezinwú n'oge ọzọ anyị na-arụsi ọrụ ike. Ụwa gà-àká n'arụ ọrụ, dịka m kwerè gị na nkwa. Ọ bụrụgodị na anyị anọghị ya, ụwa gà-àká n'eme ntụgharị.
Mụ onwe m ejighị obi m niile kwete na nke a bụ eziokwu, ị ghọtarà. Ịga eji aka gị hụ nke a ma ọ bụrụ na ị n'ele ka m si eme ihe anya ụbọchị ole na ole. Mana ndị m ji okwu ha kpọrọ ihe si na ọ bụ eziokwu, gụnyere Seneto Joe Lieberman, nwoke ana atụghị anya na ọ gà-ede akwụkwọ banyere ịdị nsọ nke izu ike. Mana nke ahụ merè eme. N'ime ya, o derè si, “Ọ dịghị onye n'ime anyị ọ dị mkpa ka ọ rụọ ọrụ ụbọchị niile nke izu. Ọtụtụ ndị mmadụ chè nà apụghị ime ihe ọbụla ma ewezụga ha—nye ezinụlọ ha, nye ndị ha na ha n'arukọ ọrụ, ọbụna nye ụwa. Ọbụrụ na m agaghị ọrụ, ọrụ ndụ m mkpọrọ ihe gà-emebi. Ọbụrụ na m agaghị gaa zụta ihe maka ụlọ, agụụ gà-agúgbú ezinụlọ m. Ọbụrụ na m agaghị n'ebe ana azụlite akwara ahụ, ahụ m niile gà-akpọnwụ.”
Ó nwerè ajọ ụjọ ahụ dịnụ, na ọbụrụ na anyị adịghị eme ihe niile n'otu oge, na ihe niile anyị kpọrọ ihe pụrụ imebi. Ma, chai, ònyé mà ụdị ngwakọta na nsogbu ụdị ihe ahụ pụrụ ibute na ndị anyị. Na nzuzo ụjọ na atụ anyị na ọbụrụ na anyị anọgideghị n'eme ihe ndị ahụ anyị nọ n'eme, ndụ anyị niile gà aghasasí. Ọ bụ uche anyị niile na nke a bụ̀ eziokwu.
N'oge gasị anyị dí mma, n'enwuké enwuké, anyị nà-ahụ na ka anyị si chee abụghị ka ọ dị. Anyị nà ahụ na ihe niile anyị jìrì bụrụ mmadụ n'ụwa ebidoghị na gwụchaa nà ihe ndị ahụ anyị kpọrọ ihe dị mkpa anyị n'eme ma ọ bụ n'arụ. Anyị nà-ahụ na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị zuo ike.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More