Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Usoro Kà Jizọs Si Eme Ihe Abụghị Nke Mgbasògidé Iwu
Mgbe anyị mecharà si n'ọrụ anyị pụọ gaa zuo ike, anyị pụrụ inwete ume na obi ike site nà, na Jizọs hụkwara uru ọ dị Ya ịhapụga ihe niile n'eme ma na-akwagharị n'akụkụ Ya wee dọgara Onwe Ya gaa zuo ike. N'iso Ya na-azụ, anyị, kwa, pụrụ ịhapụkwa arụmọrụ na njeghari n'achi ndụ anyị; anyị pụrụ ịhapụ “ndị ahụ nwere nsogbu chọrọ enyemaka anyị oge niile” bụ́ ndị n'enye iwu ma na-asị na ha apụghị ịhapụ anyị aka ma ọ bụ̀ na ihe niile gà-emebisi ma bibie ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ha ná nsogbu ha pụọ; anyị pụrụ ịhapụ ntapara n'ọrụ oge niile wee pụọ gaa chọta na nara udo ahụ kasị adị anyị mkpa. Anyị pụrụ ime ihe ndị a niile n'ihi na Jizọs merè ha nakwa n'ihi na Ọ nọ n'egosi anyị kà anyị kwesịrị isi bie ndụ. Ndị òdé akwụkwọ kà abụ sì na O wezụgarà Onwe Ya iji wee n'echetara Onwe Ya maka ụlọ eluigwe Ya. Mana ọ bụ̀ uche m na O merè otù ahụ iji wee gosi anyị ihe ndụ ana ebi n'usoro dị kà, iji gosi anyị na izu ike sí nà Chi abụghị ihe ana amanye anyị amanye ime kama ọ bụ ọkpụkpọ-òkù dị nsọ. Na igosi anyị ihe ọ dị kà iji ee si n'ime ime obi anyị za ọkpụkpọ-òkù ahụ.
Ebe a bụ̀ ebe m funahụrụ ụkpụrụ ya, dịka Ndị Juu n'oge Jizọs funahụkwarà ya. Ebidorò m mewe izu ike ka m ọ bụ ihe n'enweghị ohere mmegharị na mgbanwe, n'agba isi-ákwárà na ọ gà-ebidoriri na otu oge na n'otu ụbọchị ákarà aka, kwa izu kwa izu, na mgbe ihe ma ọ bụ mmadụ merè m enweghị m ya kà m si kwadebe, ụdị ihe ahụ n'emebisicha usoro ndụ m mà ya adị m ka m anwụọla. Izu ike m bùrùlà onyenwe m, ihe m nọ n'efe ka chi ka ihe ọbụla ghara ikpasu ya, ka m ghara ịnwụ. Ọ dịghị mgbe Jizọs hụrụ izu ike otù a. Chètá nkwupụta Ya na Mak 2:27?
Nyé Ndị Juu nọ n'ege Ya ntị ụbọchị ahụ, ọ gà-abụrịrị na obi ha ekwetaghi ihe ntị ha nụrụ. Ha ejirila ndụ ha niile n'agụ ma n'amará iwu na mmachibido-gasị nke emume Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ̀dì gịnị kà Jizọs na-akọ?
Jizọs adịghị onye Ọ chọrọ ikwuto ma ọ bụ kpasuo iwe; ọ naanị eziokwu ka Ọ nọ n'ekwupụta. Ha funahụrụ kpamkpam ebumnobi Chineke banyere izu ike site n'ịgbanwe ya ka ọ bụrụ ndepụta mèé nke a nà emela nke ọzọ. D. A. Carson derè si:
Ònyínyé e nyerè Iwu nke Ụbọchị Izu Ike abụghị ka ọ bụrụ ibu aro; ikwu eziokwu e nyerè Ụbọchị Izu Ike iji gosipụta ọmịiko Chineke maka ndị Ya, nakwa irugidè aka na àgwà Ya nke ịdị nsọ. Mana e chefurù ebumnobi a ná mpako na nnupụisi kà mgbasògidé-iwu na nrapara nà omenala tòrò. Ezi ihe ejìrì nye iwu Ụbọchị Izu Ike ka ndị amụma Chineke kwupụtara ugboro ugboro, bụ̀ ndị rutugideré aka ná mmekọrịta-ọgbụgba-ndụ Chineke chọrọ ka Ya na ndị Ya nwee, mana ha adịghị njikere ige ntị.
Jizọs enweghị mmasị maka mgbasògidé-iwu, dịka ahụrụ n'ụzọ O siri “rụọ ọrụ” n'ọtụtụ Ụbọchị Izu Ike—itutù ọka wit, ịgwọ ndị ihu na ahụ ha gbagọrọ agbagọ—nakwa n'ụzọ O si wee zuo ike mgbe ndị mmadụ cherè na O kwesịrị ịrụ ọrụ. Ihe akasị hụ anya ná nwezụga-gasị Jizọs merè abụghị na O zuru ike kama ọ bụ mgbe Ọ họọrọ izu ike. O wezụgarà Onwe Ya gaa zuo ike mgbe ndị mmadụ kà chọrọ enyemaka Ya ma mgbe obi Ya na ahụ Ya kà n'agwa Ya ka Ọ nọtukwuo mee ihe. Jizọs ezughị ike naanị mgbe a tụrụ anya na Ọ gà-ezu ike; O zukwarà ike mgbe ike ka dị Ya n'ahụ ma n'ákwárà ma ihe niile a n'agara Ya nke ọma.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.
More