Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ: Mweghachi Na Mgbake Maka Mkpụrụ-Obi N'adịghị Enwe Izu IkeIhe Nhụchatụ

Addicted to Busy: Recovery for the Rushed Soul

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Kà Jizọs Sì Eme Ihe Kwugidèsirì Ike

Ana m agụ nke a na Akwụkwọ Mak, Isi Nke Anọ. Ka O kuzicharà ihe site na mbido ruo na ọgwụgwụ otu ụbọchị, Jizọs, Ya na ndị umuazu Ya, nọ n'ụgbọ-mmiri na-agafe Oké Osimiri Galili n'eje na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Ka a hụrụ anya, n'enweghị nkwado ọbụla, ebili mmiri maliterè, n'eme ka ikuku mmiri kwabàtasiá n'ime ụgbọ-mmiri ahụ nke mere ka ndị umuazu Jizọs che na ha gà-erùgbú na mmiri. Ihe nke a kwerè m nghọta: ọbụrụ na m nọ n'ụgbọelu n'achọ ịda adà, aga m ekpe ekpere, ma ọ bụrụ na m nọ n'ụgbọ-mmiri bidoro ịtụgharị na ịma jijiji n'elu mmiri, aga m amalite ịkwado maka àkwámózú m.

Ya bụ̀ na, ebili mmiri nọ n'etigharí ebe niile, ndị umuazu Jizọs nọ n'oké egwù, ma Jizọs nọ ebe ahụ, n'arahụrụ Onwe Ya ụra n'akụkụ ụgbọ-mmiri n'achọ irùkpù erùkpú. Ndị umuazu Ya nwéburú ọṅụ jupụtara n'iwe. “Ọ̀ bụ̀ na ògbasaghí Gị na Oké Osimiri a chọrọ iri anyị?” (v. 38) ha tirì ná mkpu ka Jizọs nọ n'arahụrụ Onwe Ya ụra.

Ka e mesịrị, O kuliri n'ụra wee lezuo ihe niile ahụ n'émé anya, n'ejighị nganga ma ọ bụ̀ oké okwu, O tirì, “Mechienù ọnụ! Dị nù jìì” (v. 39).

Ọ bụghị ndị umuazu Ya ka O nà-agwa okwu kama, n'ụzọ tụrụ anya, ọ bụ ikuku na oké ifufe ahụ ka Ọ nà-agwa okwu. Nke kachasị tụọ anya bụ na: ikuku na oké ifufe ahụ rùbeerè Ya isi. Mak 4:39 n'ekwu si, “Ume gwụrụ oké ifufe ahu; osimiri ahụ bịara dị nnọọ jụụ ka ihu enyo dí sám.”

Ihe oké ebube.

Leenú ụdị obi ike ahụ. Leenú ụdị nkwegide ahụ. Leenú ụdị ọmụma na nkwenye ahụ nke “ka alaeze Gị bịa.”

Nke a bụ ihe anyị n'efunahụkarị: Mgbe Jizọs merè nkwupụta Ya maka udo na ịdị jụụ, ọ bụghị naanị n'elu otu oké ifufe ka Ọ n'ekwuputa ya; ọ bụ n'elu nà gafee alaeze dum ka O merè nkwupụta a. Ọ nọ n'ekwu, ma a kọwaa ya, “Udo na ịdị jụụ gà otu ụbọchị chịa—ebe niile, n'oge niile. Ọ gà-eru otu oge, ọdụm na nwa-atụrụ gà edinàkótá; ndị n'eri ihe na ndị ana eri eri gà-ebikótá ọnụ n'udo.”

Ihe Jizọs nọ n'ekwu bụ̀, ee, ihe nke a dị adị ma bụrụ ihe a pụrụ ihu anya ugbu a, mana ụzọ na ebíbí ndụ ọhụrụ gàjè ịbịa. Mgbe alaeze M nọkwasịrị na dị, ihe niile gà-adị jụụ na nọrọ n'udo.

Nke ka nkè, site n'itù umuazu Ya aka na ha bụ ndị ụjọ, Ọ nọ n'egosi ha na obi ike n'ekweghị ịnwụ anwụ, ná-ekweghị eme nkwaghari, pụrụ ịbụ nke ha kama ụjọ ahụ jigidere ha—na ha pụrụ ịnụ ụtọ na kporie ndụ nke ọnọdụ izu ike ahụ mgbe ọbụla ha chọrọ ya. Nke a bụ̀ ihe ha na-amaghị, na ihe na esiri anyị ike ikwenye na ya mà ụbọchị taa. Udo dị n'eché anyị ka anyị nara ya! Ọ n'akụ aka n'ụzọ ndụ anyị oge niile; ihe anyị gà-eme bụ naanị imeghe ụzọ wee nabata ya. Mana anyị gà-adị kwa njikere na chere udo kà ọ nà-abịa iku aka n'ụzọ anyị, ị̀ ghọ́tálá? Nke a bụ ihe mgbaru-ọsọ magburu onwe ya. Ebidòrò m ịghọta ihe Jizọs jìrì wee ghọrọ ibi ndụ otù ahụ. Usoro, oge na kà esi eme ihe dị mkpa. Usoro zirí ezí nke omumé ihe dị mkpa. Olileanya kà dị̀ maka mụ ime ihe n'ụzọ dị otù ahụ.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Addicted to Busy: Recovery for the Rushed Soul

Maka ndị n'ebi ndụ n'ụzọ n'aga ọsọ ọsọ, ntụziaka iji nyere gị aka ijiri ya nwaayọ na chọta izu ike. Nà Ntapara Na Nri-Ahụ Nke Ọrụ, Brady Boyd n'egosi anyị otú esi ebi ndụ na-anabata ịnọ emeghị na enweghị mkpọtụ na ịnọ jụụ, ná achọtá udo ahụ Chineke chọrọ maka anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele David C Cook maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na www.dccpromo.com/addicted_to_busy/