Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

Beginning A Relationship With Jesus

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

"Ugbu A, Gịnị Ọzọ Ka Aga Eme?"

Ịbụ́ Onye N'eso Ụzọ Kraịst pụtara "ịnọ n'ime" Jizọs. Ịkọwa ya n'ụzọ kacha dị mfe, i na-amalite ndụ nke "idabere" n'ime Ya na "ịnọkwasị" n'ime Ya. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na ịga na-agbalị itó n'ime mmekọrịta gị na Ya site n'iwebata obi gị, mkpụrụ obi gị, uche gị, na ike gị n'ụzọ zuru ezu n'ime mmekọrịta gị na Ya (Mak 12:30; Luk 10:27).

Ndị a bụ ụzọ ise anyị na Jizọs si anọ "n'ime mmekọrịta":

Anyị na Ndị Kraịst ọzọ ịnọ n'ime mmekọrịta

Ndị ụka bụ̀ ndị mmadụ ha na Jizọs barà n'ime mmekọrịta wee bụrụ ndị Jizọs gbagharawò, ha wee kpebie ibi ndụ ha maka Jizọs. Ito n'ime mmekọrịta anyị na Jizọs bụ nke ana enyere-aka site na anyị iga ụka. Ọ bụ ebe a n'ime ụlọ ụka, site na nnọkọ na mmekọ anyị na ndị ọzọ kwere ekwe, ka anyị n'amụta ihe, n'eto, n'ajụ ajụjụ, n'eje ozi, ma n'achọ ihu Chineke ma n'efekọ́ Ya òfùfè ọnụ.

N'ime nduzi nke Chineke site na ịgụ na ịmụ Akwụkwọ Nsọ

Ka ị na-etolite na mmekọrịta gị na Jizọs Kraịst, ị ga-amalite ịmụtakwu ihe banyere Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ Nsọ bụ Okwu Chineke, Ọ bụ otu n'ime ụzọ kachasị mkpa O si wee kpughee Onwe Ya na agụụ nke obi Ya na kà O si mee ma tụọ ndụ banyere anyị. Ka ị na-amatakwu Akwụkwọ Nsọ, ka ị na-amatakwu Chineke n'Onwe Ya.

Na mkparịta-ụka anyị na Chineke site n'ekpere

Ebumnobi anyị ji ekpe ekpere bụ otu ebumnobi ahụ eji aba ná mkparịta-ụka akpacha anya wee malite: iji tozuo ọnụ na mmekọrịta bara uru. Nke a pụtara na ekpere gazurù ma na-emetụ ọtụtụ isiokwu aka. Ekpere gụnyere ịkekọrịta echiche, ige ntị, ijụ ajụjụ, ịrịọ maka enyemaka, ikwupụta ihe ndị dị gị n'obi ka ewee ghọta gị, ịrịọ mgbaghara na isi na imeghiewo, inye ekele, ma ọ bụ gị na Chineke ịnọkọ nnọọ.

N'ime ihe site n'ije ozi

Ime ihe site n'ije ozi, ilebara ndị mmadụ anya, na isetịpụ aka ọma n'ebe ndị mmadụ nọ, bụ igosipụta obi nke ịhụnanya Chineke n'ebe ndị mmadụ nọ, ọ bụkwa ụzọ dị mkpa ị ga-esi wee too na mmekọrịta gị na Jizọs. N'ihi gịnị? N'ihi na nke a bụ ihe Jizọs mere. Jizọs kwuru sị, "N'ihi na ọbuná Ọkpara Nke Mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama Ọ bịara ije ozi" (Mak 10:45).

N'igosipụta ịhụnanya nye Chineke site n'ife Ya òfùfè

Òfùfè bụ ngosipụta nke ija nma, ekele, na ịtụnanya anyị kpacha anya enye Chineke. Òfùfè bụ ihe anyị pụrụ inye Chineke sọọsọ onwe anyị ma ọ bụ n'ime stádịum buru ibu, anyị na puku kwa puku ndị mmadụ. A pụrụ inye Chineke òfùfè n'ime ụlọ ụka ma ọ bụ n'ebe ogbo ahịhịa na ukwu osisi juru. Òfùfè bụ nkwupụta na ngosipụta si n'ime obi gị, nke onwe gị, na nke aghụghọ n'adịghị, nye Chineke.

Ọ bụrụ na ọgụgụ atụmatụ ihe ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ ma gị achọọ inweta akwụkwọ dum o si na ya pụta, pịa ebe a

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Beginning A Relationship With Jesus

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele David Dwight, Nicole Unice na David C Cook maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.dccpromo.com/start_here/