Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

"Ònyé ka Chineke bụ?"
Ịghọta ụfọdụ ihe bụ isi gbasara Chineke gà-enyere gị aka kà ịna amalite iso Ya. Ka anyị nwee mkparịta gbasara njirimara anọ nke Chineke:
Chineke bụ ebighị-ebi
Chineke ji okwu niile ama ama iji kọwaa Onwe Ya dịka Chi oge n'ejikwaghị: na-adịgide adịgide, dị ebighị ebi, adịghị agwụ agwụ, dị adị, dị kemgbe, ma kà gà abịa. Chineke bụ ebighị ebi. Ebighị ebi apụtaghị oge dị nnọọ ogologo, kwa ogologo. Ọ pụtara "enweghị njikwa oge". Ọ pụtara "adịghị n'ogige oge".
Chineke dị mmekọrịta
Akwụkwọ Nsọ na-akụzi n'ọtụtụ ebe na Chineke dị adị ka mmadụ atọ jikọtara ọnụ n'ịdị n'otu zuru okè. A na-akpọ nke a Atọ n'Ime Otu. Kama ịbụ Chi nke dị naanị Ya, Chineke nke Akwụkwọ Nsọ bụ Chineke Nna, Chineke Ọkpara (Jizọs Kraịst), na Chineke Mmụọ Nsọ. Ha bụ ndị atọ dị iche n'Onwe Ha, mana ha na-ebi ma na-arụkọ ọrụ n'izu oke.
Chineke zuru okè
Chineke zuru okè ma ọ nweghị mgbe Ọ ga emekata dị ná mkpa mmezi ma ọ bụ mmelite. Ọ dịghị ihe Ọ dị nà mkpa ya—àgwà, ịdị ọcha, ọmụma ihe, ike ma ọ bụ ikike. Karịsịa ma eji ya tụnyere anyị, Chineke ziri ezi n'ụzọ zuru okè. Akwụkwọ Nsọ n'ekwu sị, "Chineke bụ Ìhè; N'ime Ya, ọchịchịrị adịghị ma ọlị" (1 Jọn 1: 5).
Chineke bụ "omni"
Chineke bụ omnipresent, Ọ bụ omnipotent, ma bụrụ omniscient. Okwu ndị a pụtara (n'usoro na nkọwa) na Chineke "nọ ebe niile n'otu oge," na O "nwerè ma dị ike niile," na Ọ "maara ma n'ahuzù ihe niile n'otu oge." Ọ dị ike ịnọ n'ebe niile n'otu oge, Ọ dị ike karịa ihe niile dị adị, Ọ mazukwarà ihe niile.
Ma kedụ ihe mere ihe ndị a niile ji dị mkpa?
Ịghọta kà Chineke si dị ebighị ebi n'enye m olileanya. Imará na Ọ dị mmekọrịta pụtara na mụ na Ya nwerè ike ịkpakọrịta ụka. Imará na O zuru okè pụtara na ọbụna mgbe m n'aghọtaghị ihe n'eme na ndụ m ma ọ bụ gburugburu m, a pụrụ m ịtụkwasị Chineke obi. Ma ịmara na Ọ bụ ihe niile pụtara na Ọ bụ Ya ji ike niile, na Ọ hapụghị anyị ka anyị nọrọ naanị anyị, na aga emeri ihe niile rụrụ arụ ma dị njọ.
Ya merè, Ònyé ka Chineke bụ? Ọ bụ Ya bụ́ Onye keré gị, Ọ bụ Ya bụ Onye hụrụ gị n'anya karịa ka ị pụrụ iche n'echiche, Ọ bụ Ya bụ Onye nyefere Ọkpara nke Ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ka Ọ nwụọ ka gị na Ya wee nwee ike ịnọ na mmekọrịta dị ebighị ebi.
Imará Chineke n'agbanwe ka anyị si ahụ ndị mmadụ—anyị ga-ebido na ahụ ha ka mkpụrụ obi gasị dị ebighị ebi, abụghị anụ ahụ gasị n'adịghị adịgide adịgide.
Imará Chineke n'enyere anyị aka iché ihe isi ike ihu n'ụzọ dị iche. Imará Chineke pụtara na ọ gaghị adị anyị ka ọ dịghị ihe pụrụ ịdị nchịkwa ná ndụ anyị. Imará Chineke n'eme ka anyị dị nguzosi ike nà obi umeala na nzube. Imará Chineke n'enyere anyị aka ihụta ndụ ka ihe nwere isi.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.
More