Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

"Onyinye A N'enye Kà Nhọrọ"
Otu n'ime akụkụ dị ịtụnanya nke okwukwe Ndị Kraịst bụ na mmekọrịta a anyị na Jizọs n'enwe bụ nke a na-enyekarị dịka nhọrọ. Ọ dịghị mgbe ana amanye ya amanye.
Otu mgbe o nwerè otu nwa okorobịa gbarala ọsọ bịakwute Jizọs, n'ajụ ihe ọ dị mkpa ka o "mee" iji keta ndụ ebighị ebi (Mak 10: 17–22). Dị ka Jizọs na-emekarị, O duziri mkparịta-ụka Ya na nwa okorobịa ahụ ka yabụ nwa okorobịa nwee ike ịhụ onwe ya nke ọma.
Ya merè na Jizọs ajụghịdị nwa okorobịa a obi ya dị oghé ajụjụ ọbụla. Ọ gara n'ihu na-agụpụta iwu iri ahụ enyere ndị Juu ka ha dobe, ma nwa okorobịa ahụ tiri si, "Ee, ee, edebego m ha niile!" Mana ihe merenụ na-nsote bụ nke na-akpali ezigbo mmasị. Mak 10:21 kwuru, sị, "Jizọs lere ya anya wee hụ ya n'anya."
Jizọs lere anya. Ọ dịghị ozi ọbụla O ziri. Ọ dịghị mkpịsị aka ọbụla O fere ya n'ihu. Kama, O lekwasịrị nwa okorobịa a anya kpọmkwem wee buru echiche dum nke obi Ya na uche Ya tụkwasị nà onye a, wee na-akpọ ya òkù ka ọ bịa banye n'ime mmekọrịta nke Ya na ya.
Jizọs hụrụ n'anya. Ọ bụ site nà ile anya Ya ahụ ka ịhụnanya si wee malite. Ọ bụghị n'ihi kà nwa okorobịa ahụ si wee guzosie ike n'idebe iwu ndị ahụ ma ọ bụ ihe ndị dị ịtụnanya o merè. Jizọs lekwasịrị ya anya ma hụ ya n'anya n'ihi na ọ bụ onwe ya, ọ bụghị onye aghụghọ.
O doro anya na nwa okorobịa ahụ hụrụ ihe gbasara Jizọs n'anya nke ukwuu wee chọọ ime nhọrọ dị nma. Mana mgbe Jizọs kpọrọ ya òkù ka ọ banye n'ime mmekọrịta nke ha abụọ, ihe O bu n'obi bụ ka nwa okorobịa ahụ tinye onwe ya na ihe ya niile dum n'ime yabụ mmekọrịta: "Gaa, ree ihe niile i nwerè wee nye ha ndị ogbenye, ma ị ga-enweta akụ n'eluigwe. Mgbe ị mecharà nke a, bịa soro M" (Matiu 19:21).
Mgbe Jizọs lekwasịrị nwa okorobịa a anya wee hụ ya n'anya, O maarà ihe kpọmkwem Ọ ga-ajụ ya ka O wee kpughee ihe dị ya n'obi. Site n'irutu aka na ihe onwunwe, Jizọs gara kpọmkwem n'ihe bụ isi na dị oké mkpa nye nwa okorobịa a.
Yabụ na Jizọs lekwasịrị ya anya, hụ ya n'anya, wee debe n'ihu ya nhọrọ maka ịbanye na mmekọrịta. Ma n'agbanyeghị ihe ndị a niile, nwa okorobịa a tụgharịrị si n'ebe Jizọs nọ, pụọ. Nke a bụ ihe dị ịtụnanya Chineke n'eme. Chineke ji ike niile dị adị n'ime mmekọrịta Ya na onye ọ bụla n'ime anyị, mana n'ụzọ n'ejuanya, Ọ n'enye anyị nnwere-onwe isi Ya ee ma ọ bụ mbà.
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwu, sị, "Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka anyị na Ya nwee mmekọrịta, gịnị merè O keghị anyị otú ahụ ka o wee dị mfe?" Mana a pụghị ịtụ ma ọ bụ ikè ịhụnanya otù ahụ. Ọ bụrụ na amanyerè anyị isi Jizọs ee, manye anyị ịbụ ndị n'eso ụzọ Ya, nke a ga-emegịde kà Chineke si akpa àgwà na isi-ihe nke ịbụ Ndị Kraịst—na onyinye Jizọs n'enye sitere na dabere n'ịhụnanya, ụdị ịhụnanya nke kachasị dị ọcha.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.
More