Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

Beginning A Relationship With Jesus

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

"Njirimara Ọhụrụ"

Ikike ịghọ ụmụ Chineke kwerè omume site na Jizọs, ma ozi dịnụ magburu onwe ya bụ na n'ihi Jizọs, Chineke n'ekwu gbasara anyị otu ihe ahụ O kwuru gbasara Jizọs. Ịdị njikere ịnụ ya? Kam gwa gị ya: "Ị bụ Ọkpara M, M hụrụ n'anya; na Gị ka M kachasị enwe obi ụtọ" (Mak 1:11).

N'ihi Jizọs, Chineke n'ekwu gbasara gị otu ihe ahụ O kwuru gbasara Jizọs. N'otu nkwupụta a, Chineke na enye anyị nnukwu obi ike megide erughị eru na adịghị nma gasị bụ́ ụzọ anyị si ahụ onwe anyị anya—agụụ nke ahụ miri emi, ná-emetụta anyị n'ọkpụkpụ banyere isonye, inata ịhụnanya, na inata nnabata na ihu-ọma ndị mmadụ. Rịba ama ihe atọ dị iche n'onwe ha dị na nkwupụta a bụ nkwa:

1. Ị bụ Ọkpara M ...

Mgbe Chukwu n'ekwu si, "Ị bụ Ọkpara M," Ọ n'ejikọ Onwe Ya n'ihe gbasara anyị. Ọ n'ekwu na Ọ chọrọ iso anyị n'eme ihe niile anyị n'eme, na anyị bụ otu.

Ihe mbụ sitere na njirimara ọhụrụ a bụ na anyị bụ ndị mmadụ Chineke n'enwe oké aṅụrị anyị na Ya ịnọkọ. Ọ n'ekwu si, "Ee, onye a bụ nwa m nwaanyị; onye a bụ nwa m nwoke." Ọ dịghị mgbe Ọ na-agbahapụ anyị ozugbo anyị burula ụmụ Ya. Ihe nke a ọ dịghị ịtụnanya, na Ọ dị oké obiọma n'ebe anyị nọ, n'agbanyeghị àgwà ọjọọ anyị megide Ya kwa mgbe kwa mgbe!

2. Onye M hụrụ n'anya ...

Mgbe ụfọdụ ná mmekọrịta anyị na ndị ezinụlọ anyị, ọ bụghị mgbe niile ka ụdị mmadụ ha bụ na-amasị anyị, ma ọfọ anyị ihụrita ha n'anya ka anyị kwesịrị. Ọ bụrụ na ị nwerè onye ezinụlọ ihe ya n'adịghị amasị gị, o nwerè ike ịdị gị ka, Ee, aga m asị na ọ bụ nwanne m, mana ihe ya adịghị amasị m ma ọlị.

Mana Chineke adịghị otù ahụ. Ọ bụghị naanị na Chineke n'ekwu si, “Ee, Ọ bụ Ọkpara M,” Ọ na-ekwukwa si, “A hụrụ M Ọkpara a n'anya. Mmasị M na obi ụtọ M dị n'ahụ Ya. Obi M dị n'ebe Ọ nọ ma n'etí maka Ya.”

3. N'ebe Ị nọ ka M n'enwe obi ụtọ karịsịa.

Chineke n'eji okwu a mara nma n'atukwasa kà ikpeazụ n'elu nkwa O na-ekwe, "Ihe niile Ị n'eme masịrị M." Chi nke bụ Ya konyecharà kpakpando niile dị na mbara igwe si na i juru Ya eju n'obi. Ọ dịghị ekwu nke a banyere onye ọ bụla ọzọ—ọ bụ gị.

Ka anyị nà-etolite n'ịghọta obi Chineke maka anyị, nkwupụta ndị a n'eji nwaayọ ná-ejuputa ma ná-asachicha akụkụ gasị na ebe niile ahụ nke mkpụrụ obi anyị anyị n'enwe mmetụta erughị eru, na agụụ ọchịchọ nke ịba uru nye onwe anyị nà ndị mmadụ. Ihe ndị ahụ niile anyị nọ n'eme iji nwete nnabata ndị mmadụ, iji bụrụ ndị dị mkpa, iji nwee mmetụta ịdị mkpa, iji bụrụ ndị ana ekiri ekiri, iji bụrụ ndị ọkwa ha dị elu n'uche ndị mmadụ—ugbu a anyị nwerè azịza nye ihe ndị ahụ niile. Azịza n'esighị n'aka ndị mmadụ, azịza n'esighị na ihe onwunwe n'adịghị emejupụta obi anyị, azịza n'esighị na aha-otutú na ọkwá gasị ... kama azịza sitere na Chineke.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Beginning A Relationship With Jesus

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele David Dwight, Nicole Unice na David C Cook maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.dccpromo.com/start_here/