Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

Beginning A Relationship With Jesus

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

"Onyeisi Bụ Ezie"

Otu ụzọ isi kọwaa onye Jizọs bụ̀, bụ ịkọwa Ya dịka onye nnapụta nọ n'ọrụ nnapụta. Mgbe Jizọs sịrị, "Abụ M Ụzọ na Eziokwu na Ndụ," Ọ sighi, "Abụ M otu ụzọ na otu eziokwu na otu ndụ."

Ajụjụ ndị anyị n'ajụ Ya dịkwa ka nke ndị anyị n'ajụ onyeisi ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọ-mmiri anyị nọ n'ime ya n'ihi anyị chọrọ ima, "Ị bụ̀ onyeisi ụgbọ n'ezie (Ọkpara Nke Chineke)?"

Ka ndụ na-aga n'ihu, ọkụ nke obi ọtụtụ n'ime anyị banyere ajụjụ a n'eji nwaayọ anyụ. Obi n'adị ọtụtụ n'ime anyị nma naanị inwete oche nwere nnukwu oghere maka mgbatị-ukwu n'ime ụgbọelu anyị nọ n'ime ya. Ma ọtụtụ n'ime anyị adịghị eji uche na echiche kwesịrị ekwesị eso ọbụbụ mmadụ anyị ka a tụrụ anya, ma ọ bụrụ na anyị nọ n'ụgbọ mmiri n'emi emi. Mana ma enwerè obi siri ike na onye bụ isi ụgbọ bụ̀ ajụjụ dịnụ n'akụkọ atụ abụọ a enyerè.

N'ime ụgbọ mmiri ahụ, nkwenye gị (ma ọ bụ na ọ bụghị) ná onyeisi ụgbọ bụ ihe bụ isi ana akọ. Otú ahụ ka ọ dị n'ebe Jizọs nọ. Ọ bụrụ na ọ bụ nnapụta ka a chọrọ ime anyị, ọ dịghị kà anyị gà-asị, "A pụrụ m ịga ụzọ ọbụla m chọrọ." Ee, ị pụrụ ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ịchọrọ, mana ọ bụrụ na Ọ bụ onyeisi n'ezie, Onye mazuru ihe niile gbasara ọdịdị ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-abụ na Ọ maara ụzọ n'ezie.

Ma o nwerè ike ịbụ na ka ị bidoro nyochawa ihe Akwụkwọ Nsọ n'ekwu gbasara Jizọs, i malitere jụwa onwe gị ajụjụ a, "Ekwenyerè m n'ezie na Ọ maara ụzọ?"

Ọ bụrụ na ịna agụ atụmatụ ihe ọgụgụ a, o nwerè ike bụrụ, ma ọ bụ ọ bụghị, na ị bịarutela n'ebe ị pụrụ iza ee nye ajụjụ a. Ma ọ bụ o nwerè ike izala si, "Ee, ekwenyerè m. Mana akà m nwerè ajụjụ." Ọ bụrụ na ị bụ ụdị onye ma ọ bụ mmadụ anyị n'ekwu okwu ya, anyị nọ ebe a inyere gị aka na ijide gị aka na njem gị banyere ajụjụ a. Dị ike n'ajụ ajụjụ gasị i bù n'obi gị. Anyị n'eto site n'iju ajụjụ ndị dị nma, dịka nke a. Obi abụọ nà ejighị ihe ọbụla n'aka gasị abụghị ihe ndị ana adịghị ahụ anya.

Ma ka anyị kwuo na i kwenyerè na Jizọs ma ụzọ. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ajụjụ mbụ i nwerè ike inwe bụ, "Ọ bụ gịnị ka m ga-eme iji malite iso na ije ije n'ụzọ ahụ?"

Ma ebe a bụ ebe Jizọs n'eme anyị ihe ịtụnanya. Ọ dịghị asị, "Soro nke a." Ọ na-asị, "Soro M." Onye isi ụgbọ mmiri ahụ asighi anyị gaa lelee maapụ iji mara ụzọ; ọ tụrụ onwe ya aka si anyị lee na soro ya. Jizọs na-atụkwa Onwe Ya aka, wee na-akpọkwa anyị òkù ka anyị tinye obi anyị na ndụ anyị n'iso Ya.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Beginning A Relationship With Jesus

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele David Dwight, Nicole Unice na David C Cook maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.dccpromo.com/start_here/