Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

"Ajụjụ Gasị"
Ndị nwere onyinye na nkà mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ ndị na-ajụ ụfọdụ ajụjụ kachasị mma. Nke a bụ ebe Chineke bụ nnukwu ọkacha mara.
Lelee ụfọdụ ajụjụ kachasị mma Chineke jụrụ:
Ebee ka ị nọ? (Jenesis 3: 8-9)
Site nnọọ na mmalite Akwụkwọ Nsọ, Chineke gosipụtara akụkụ a nke àgwà Ya site ná mmekọrịta Ya na Adam na Iv–mmekọrịta dị ntụkwasị obi, nke aghụghọ n'adịghị na ya, kwa ụbọchị.
Na Jenesis 3, anyị n'agụ ebe Adam na Iv họọrọ ịhapụ Chineke wee malite ibi ndụ Ọ n'esoghị na ya. Mgbe mmekọrịta ahụ mebiri, Chineke n'onwe Ya bịara chọọ Adam na Iv. Ọ bịaghị ịta ha ahụhụ ma ọ bụ menye ha ihere kama Ọ bịara iweghachi mmekọrịta dị n'etiti Ya na ha.
Mgbe ịna enwe mmetụta nke aka ná mmụọ Chineke n'akpaghari n'ime ndụ gị, gị nwa, kwa, bụ onye Ọ n'achọ ka gị na Ya nwee mmekọrịta, ka ị wee nwee ike ịmata Ya ma gị na Ya ebiri na mmekọrịta.
Kedụ ihe ị chọrọ? (Jọn 1: 35-39)
Na Jọn 1, anyị na-ahụ Jizọs ná-ajụ́ ụfọdụ ndị ikom chọrọ ịmatakwu banyere Ya ajụjụ dịka nke Chineke. Ọ jụrụ ha, "Gịnị ka unu chọrọ?" (Jọn 1:38).
Ndị nwoke ahụ zere ajụjụ ahụ ma gbanwee ihe a na-akọ, wee jụọ Jizọs, "Olee ebe Ị bi?" Kama inye ha adreesị kpọmkwem, Jizọs zara ha, sị: "Bịanụ ... wee hụ" (Jọn 1:39). Kama inye ha azịza, O nyerè ha ọkpụkpọ-òkù.
Ọtụtụ oge, ọtụtụ n'ime anyị na-asịkarị Chineke, "Achọrọ m ka Ị nye m ihe," ma Chineke ana agwa anyị, "Achọrọ M ka Mụ na gị nọkọọ."
Ònyé ka ị si na M bụ? (Matiu 16: 13-15)
Nke a bụ ebe iso Kraịst si amalite. Azịza gị nye ajụjụ ahụ bụ mmalite gị ebe a, n'ihi na ọ bụ ebe a ka ọ ga-edo gị anya ihe ị n'eche banyere Jizọs. N'ụzọ dị nma, edeturu ihe Jizọs kwuru gbasara Onwe Ya n’ime Akwụkwọ Nsọ, gụnyere Jọn 10:36, Jọn 11:25, Jọn 10:11, Jọn 8:58.
Ihe ndị a bụ ụfọdụ okwu Jizọs kwuru—ka Ọ ga-esi aza ajụjụ gbasara Onye Ọ bụ. Ma Jizọs akwụsịghị ebe ahụ; O werụtere ya nso nso Onwe Ya.
Ị̀ kwenyerè na nke a? (Jọn 11: 25-26)
Jizọs na-emekarị ka ihe dị nso nso Ya ma ọ bụ mmadụ. Ọ si ndị na-eso ụzọ Ya, "Mana unu—Onye ka unu si na M bụ?" O wee si Mata na Jọn 11: 25-26, "Mana ngị ị kwenyerè na nke a?"
Jizọs n'ajụkwa anyị ajụjụ ndị a, ma ịza ajụjụ ndị a bụ akụkụ nke anyị na Chineke ịnọ na mmekọrịta, nke ịchọta Chineke na ịchọta eziokwu. Ma ịchọta eziokwu na-amalite na Jizọs Kraịst.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.
More