Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibido Mmekọrịta Gị Na JizọsIhe Nhụchatụ

Beginning A Relationship With Jesus

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

"Iwu Gasị Megide Mmekọrịta"

Ọ bụrụ na gị emee ọchịchọ ngwangwa banyere ihe a kọwara Iso Jizọs kà, ọ ga-abụ na ịga ahụ nkọwa dịka "ịgbaso nkuzi Jizọs." Ma nke ahụ bụ eziokwu—Iso Jizọs bụ ịgbaso na ime nkụzi Jizọs niile. Nsogbu enwerè bụ na ọtụtụ ndị mmadụ gbanwere "iso Jizọs" ka ọ bụrụ "iso iwu gasị"—ma nke ahụ abụghị ihe iso Jizọs bụ̀.

Akụkọ nke Akwụkwọ Nsọ merè ka o doo anya na isi-ihe anyị ịmara Jizọs bụ ka anyị na Ya nwee mmekọrịta, abụghị isochi iwu kwa iwu. Ka ị na-amalite inyocha ihe Chineke na-agwa anyị gbasara Onwe Ya site na Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na anyị na Ya ịnọ ná mmekọrịta apụghị ịkwa aka na nke jupụtara n'ịhụnanya bụ isi-ihe a na-akọ.

Ya merè na ikwu na isi-ihe nke iso Jizọs bụ ịgbaso iwu dịka isi na isi-ihe nke alụmdi na nwunye bụ ka di na nwunye kee ụgwọ na ibu ha bùgasị. Nke ahu abụghị ma ọlị ihe anyị tụrụ anya ịhụ ma ọ bụ inweta banyere akụkọ ịhụnanya anyị!

Echiche a nke ịgbaso iwu gasị megide mmekọrịta bụ nnukwu nkewa n'egosipụta ọdịiche dị n'etiti Iso Ụzọ Kraịst na okpukperechi ndị ọzọ. Ebe ọtụtụ okpukperechi na-akụzi na ụzọ isi 'dị mma' bụ site na ime usoro ihe gasị na inwe nkwenye-gasị siri ike ka ígwè, Iso Ụzọ Kraịst na-amalite n'ebe dị iche.

Site na oge izizi, amaghị ndị n'eso ụzọ Kraịst dịka ndị na-agbaso iwu ma ọ bụ "ịdị mma." Ihe tiri ka anyanwụ—ihe akpụ n'ọnụ, bụ̀ ihe a hụrụ n'ezie na "ha na Jizọs nọkọrọ" (Ọrụ Ndịozi 4:13). Ọ bụghị na ha nakweere Jizọs, ọ bụghị na ha gbasoro usoro omume ihe nke Jizọs, kama ọ bụ na ha na Ya "nọkọrọ".

Ha na Jizọs ịnọkọ bụ ihe gbanwere ndị mmadụ a Akwụkwọ Nsọ kpọrọ "ndị n'ejeghị akwụkwọ, ndị nwoke nkịtị" ka ha ghọọ ndị nchịkwa jupụtara n'obi ike, n'adịghị ezo ọnụ n'ikwu okwu. Ma ọ bụ otu ihe ahụ a hụrụ anya ka ana enye anyị mgbe Jizọs na-akpọ anyị òkù ka anyị na Ya nọrọ ná mmekọrịta: ka "anyị na Ya nọkọọ."

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Beginning A Relationship With Jesus

Ị̀ nà-amalite n'okwukwe ọhụrụ na Jizọs Kraịst? Ị̀ chọrọ̀ ịmatakwú banyere Iso Ụzọ Kraịst ma ị maghị ihe—ma ọ bụ otú—ịgà esi jụọ ajụjụ? Ngwa bido ebe a. Ewepụtarà nke a n'akwụkwọ "Bido Ebe A" nke David Dwight na Nicole Unice derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele David Dwight, Nicole Unice na David C Cook maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.dccpromo.com/start_here/