Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Kedụ Ihe Dị Mma Apụrụ̀ Ịhụ Anya Ịgà Ahapụrụ́ Ndị N'esote Gị N'azụ?
“Ihe nna ji ike ya niile achụso, ka ụmụ ya gà-eji nwa obere ike achụso. Ihe nna ji nwa obere ike achụso, ka ụmụ ya gà-eme anya ka ha ahụghị ya . . . ma gị bụ́ nna agaghị ama kà isi chụso ihe ndụ gị ma ọ bụ̀ mee ofuma ruo mgbe ị hụrụ ihe ndị ụmụ ụmụ gị n'eme!”
Mgbe mbụ m nụrụ otu onye ka o kwuru okwu a, oké iwe kpalirì m n'obi. Ihe ahụ o kwuru agaghị abụ eziokwu, ọ bụghị mgbe niile ka ọ n'eme. Mana onye a n'ekwu okwu jìrì ọtụtụ ọmụmaatụ siteré n'Akwụkwọ Nsọ gosipụta na okwu ya bụ eziokwu.
Ebraham. Buurù onwe ya nyefee Chineke kpamkpam. Ruberè isi. Mepụtara okwu ahụ ana akpọ okwukwe. Aịzik nwa ya nwoke? Ọ bụ̀ n'ezie nwoke ma Chineke, mana ọ dị ihe a n'adịghị mma o merè bụ nke inupù isi na ndụmọdụ Chineke wee gbagaa Ijipt. Na o nwerè oge ahụ ọ si na nwaanyị ya bụ nwanne ya nwaanyị, njọ nke nna ya kparà ka àgwà ọtụtụ afọ gara aga.
Ihe ahụ onye ahụ n'ekwú okwú n'akọ ọ bụ̀ eziokwu ma i lee anya nà ụmụ ụmụ ha?
Ụmụ Aịzik, Jekọb na Isọ maarà Chineke. Mana kedụ kwanu maka aghụghọ ahụ Jekọb jirì nara Isọ ikike ya ka ọkpara? Nà ọsọ ọsọ ọdị Isọ inyepụ̀ ikike ya ka ọkpara ka o wee nata efere jupụtara na nri?
Isi okwu bụ na anyị bụ́ ndị nna kwesịrị ichụso Chineke jiri ike anyị niile, abụghị jiri ume ngwu na nzuzu. Ụmụ anyị n'eji obi ha ekpebi kà okwukwe ha kwesịrị isi dị ha mkpa site n'ile kà okwukwe anyị si dị anyị mkpa.
Ahapụlà ohere ọbụla. Jiri ike gị mee ihe niile i kwesịrị ime. Mee mkpebi ịbụ nwoke n'eso Jizọs n'ihu ọhaneze, adịghị asụ̀ ngọ̀ngọ̀ n'ihe Ya, ihere adịghị eme, n'ekpesi ekpere ike, n'eji ike enye otu ụzọ n'ụzọ iri ya, jupụtara na amara.
Ị nwerè ike ịma, ọ bụrụgodị site n'ụbọchị taa gaa n'ihu, na i jì nnú-ọkụ obi gị niile chụso Chineke. Ekwela ka onye ọbụla kpọọ gị nwoke n'adịghị anụ ọkụ ọzọ.
O nwerè ike ya abụrụ na ụmụ ụmụ gị gà-emekwa ka i merè!
Ajụjụ: Ụmụ gị hà pụrụ isi na ị dị ọkụ n'ịhụnanya gị gbasara Jizọs?
Atụmatụ Ihe Ọgụgụ a ọ marà gị aka ka ị kulie mee ihe ka nna?
Mụtakwụọ ihe banyere Radical Wisdom devotional.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.
More