Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Ịna Enwete Ihe Ịna Etò
Ìhútùbèlá ebe nne mụrụ nwa “n'ètechá” nwatakịrị ya nwaanyị, n'egosi ya ka esi eji ntecha ihu, ntecha ntì, uri anya na ntecha ọnụ etezi onwe ya, mgbe ọ ka bụ nwata? Mgbe etecharà ya ihe ndị ahụ niile, àsí ya na ọ magbuola onwe ya na mma, abụghị n'ihi na ọ mara mma n'ezie, mana n'ihi yabụ nwata (ma ọ bụ nne ya) n'agbalisi ike ime ka ọ maa mma.
Ìgátùbèlá gaa kirie nwa egwuregwu asọmpi wee hụ ka otu nna si wulie elu ma tie mkpu ọñụ ka nwa ya nwoke merirì ndị akụkụ nke ọzọ? Ya ana eti ndị mmadụ aka ọñụ, n'ebigharị ndị mmadụ aka ma n'ejegharị ka nwa ya nwoke ahụ n'aga n'ihu n'emekwu mmeri.
Ebiela m ọtụtụ oge wee hụ ka ụmụ ntakịrị nwoke na nwaanyị ndị ahụ toro ghọọ nna nwoke na nne nwaanyị, ma ahụrụ m na ịna enwete ihe ịna eto!
Mgbe anyị n'eji ọtụtụ awa na ego ana apụghị ịgụ ọnụ wee n'ejikechí ụmụ ntakịrị anyị na ndị n'eto eto, anyị gà-enwete “ụmụ ndị nwere oké mmasị na akpịrị iyi èfé n'ewú ewù” mgbe ha toro. Mgbe naanị ihe ana eto ndị ụmụ ntakịrị nwoke anyị maka ya bụ ka ha si mee ọfụma n'asọmpi egwuregwu, anyị gà-enwete ndị asọmpi egwuregwu bụ̀ mmalite na ọgwụgwọ ndụ ha mgbe ha toro.
Iyì efe na ime ntecha adịghị njọ n'onwe ha, ọ dịghịkwanu ihe dị njọ n'igwu egwuregwu nke asọmpi.
Mana kpachara anya ihe ị n'eto n'ime ụmụ ntakịrị gị.
Nà ka m si asụ asụsụ, okwu ahụ bụ́ “ito” ka enwerè ike isụgharị ka “ija mma.” Ihe ịna aja mma n'ime ụmụ ntakịrị gị bụ̀ ihe ha gà achụsoro onwe ha mgbe ha toro.
Tụlee itò obi ebere ụmụ gị nwerè maka ndị ọzọ. Ịhụ ha ka ha nà-emere nwanne ha nwoke ma ọ bụ nwanne ha nwaanyị ihe dị mma ma ọ bụ nyere ha aka, jaa ha mma maka ya. Too ha maka ikpe ekpere, ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ịjụ ajụjụ maka Jizọs, na iwerè ego ha nye ụlọ ụka, ndị nná ego maka ndị n'ọnweghị ka ọ dị ha, ma ọ bụ ndị ogbenye.
Cheta, ịna eme ndú mgbe niile. Ajụjụ dịnụ bụ́ èbee ka i dù ndị so gị n'azụ eje.
Ajụjụ: Ìgà èmé ndú site n'ito ihe ndị i tụrụ anya inweté mgbe ụmụ ntakịrị gị toro ghọọ okenye?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.
More