Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Ụmụ Atụrụ N'enweghị Onye-Ọzụzụ

Ụmụaka dị̀ kà atụrụ. Ha n'eto ma n'etowanye ka ha ghọọ okenye, mana n'oge ugbu a, ọ bụ̀ ntorobịa na ike ha n'eme ka ha n'emesi ike—ma ámaghí ihé ha n'eme ka ha nọrọ na mpaghara ihe ize ndụ.

Dịka ụmụ atụrụ, ọ dị mkpa ka ha nwee onye ọzụzụ . . . onye ga n'elekota ha ma na-achịkwa ha. Ọ dị mkpa ka ha nwee nna. Nna bụ́ nna n'ezie. Mana n'ụzọ dị mwute, ama m ọtụtụ ụmụaka n'eto n'enweghị onye ọzụzụ.

Ana m atụ anya na i sò bụrụ ndị nna ji ọrụ ọzụzụ ha kpọrọ ihe. Gịnị ka nna n'azụ ụmụ ya ka atụrụ n'eme?

  1. Ọ n'eme nlekọta - Dị nnọọ ka ndị n'azụ atụrụ mà ebe ụmụ atụrụ ha nọ oge niile, otú ahụ ka ndị nna mà ebe ụmụ ha nọ . . . n'anụ ahụ, ná mmekọrịta, na n'ime mmụọ.
  2. Ọ nà-achịkota - Ndị n'azụ atụrụ nà-edebe ụmụ atụrụ ha otu ebe. Ndị nna nwerè òfú ọrụ ahụ, ma nke ahụ nà-amalite na ha ịnọgidesì nwunye ha ike na hụ ha n'anya. Ị̀ pụghị ịchịkọta ụmụ atụrụ ma mee ka ha nọrọ otu ebe ọ bụrụ na gị ekwe ka atụrụ ukwu abụọ bụ nne na nna (gị na nwunye gị) gbasàsịá.
  3. Ọ n'enye nri na ihe - Ndị n'azụ atụrụ bụ̀ ndị bụ isi n'inye ụmụ atụrụ ha nri. Ọ dị mkpa ka ndị nna n'èmeré ụmụ ha nke a. Èkwesịghị inwe nna n'adịghị enye ezinụlọ ya nri . . . karịsịa onye si na ọ n'efe Jizọs. Gụnyeré igbò mkpa anụ ahụ ha, ndị nna kwesịrị inye ịhụnanya adịghị arịọ arịọ ịnata ya na nke n'enweghị oké nye ụmụ ha, ma nyekwa ha nri nke ime mmụọ ha.
  4. Ọ n'èchebé - Ndị n'azụ atụrụ n'eji ike ha niile achụpụ onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla gà emerụ ụmụ atụrụ ha ahụ ma ọ bụ duhie ha. Ndị nna n'èchebé ụmụ ha megide ihe ọjọọ si n'ezi ma gbaa mbọ hụ na ha agaghị eji aka ha merụọ ụmụ ha ahụ site n'iwe, ejighị mkpachara-anya ma ọbụ ezi uche eme ihe, ma ọ bụ emeghị ihe ha kwesịrị ime.

Ọtụtụ ndị nna gà-ahapụ ụmụ atụrụ 99 ha gaa chọta otu atụrụ ahụ gafurú agafù. Ị̀gà elekọta, chịkọta, nye ụmụ atụrụ gị nri ma chebe ha?

Ajụjụ: Anya gị ọ dị mmepe ma gị adị mkpachara-anya ịhụ, mara ma ghọta mgbe otu n'ime ụmụ atụrụ ịna azụ n'agahie agahiè ma ọ bụ chọrọ imewe ngahiè?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Radical Mentoring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://radicalwisdombook.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara