Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Irikọtá Nri Abalị Ọnụ
A pụrụ m iji mkpịsị-aka nọ n'otu aka m guzuo ihe ndị nwunye m gbarà isi akwara maka ya. Irikọ nri abalị ọnụ bụ̀ otu n'ime ha.
“Olee mgbe ịgà alota ụlọ?” ka ọ gà-ajụ m. “Eji m nnukwu ọrụ na-aka . . . nye m nwa obere oge ka m mechaa” ka m gà-aza ya. Nke ahụ agaghị aba ya n'ime ntị, o wee zaghachi m si, “Hapụgásiá ihe ndị ahụ jigideré gị ebe ahụ ma bido lọtawa ụlọ. Anyị n'erikọ́ nri abalị ọnụ n'ezinụlọ a. Aga m akwadochá ihe niile ma anyị adị njikere nọrọ na tebụl ebe anyị n'eri nri n'ihe ji minit iri atọ gafee elekere isii!”
Ọ bụ̀ eziokwu na eji m olu ike wee kwuo okwu a, mana ụgha adịghị ya. Nwunye m gbadosirì ụkwụ ya na-ala ike ka anyị niile n'erikọ́ nri ka ezinụlọ kwa abalị. Na mbụ ahụghị m uru ya.
Mana ka oge nà-aga, karịsịa ka ụmụ m bidoro towe bụ́wá okenye, ahụrụ m uru ọ bara. Ọ bụ̀ otu oge n'ihe niile anyị n'eme n'ụbọchị ànyị nà-anọkọ ọnụ wee n'ahụ onwe anyị, anya na anya, imi na imi. Ọ bụ̀ oge anyị nà-akparịta ụka. Ọ bụ̀ oge anyị pụrụ ịnụ ihe na-aga n'obi ha, ma ha anụkwa ihe na-aga n'obi anyị bụ́ ndị mụrụ ha. Ọ bụ̀ oge ha pụrụ ịhụ ka nne ha na nna ha si ekwusara onwe ha okwu, sị arụkọ ọrụ, sị ahụ onwe ha n'anya. Nwanne nwoke na nwanne nwaanyị nọkotarà ọnụ wee n'ekụritá ikuku ọma nke ezinụlọ.
Ọ bụrụ na ọ bụghị n'ụlọ, kedụ ebe ụmụ anyị gà-amụta gbasara ịhụnanya n'adịghị ahapụ onye ọ si na ọ hụrụ n'anya, kà ezinụlọ kwesịrị isi n'eme ihe, nkwugidesi ike n'ejighị́ aghụghọ, ọmịiko dị omimi, imezi esemokwu dị n'etiti otu onye ezinụlọ na ibe ya, mgbaghara? Ònyé gà-akwadó ha maka alụmdi na nwunye na ndụ nke ezinụlọ? Amaghị m maka “ụlọ akwụkwọ ndị di” ma ọ bụ “ụlọ akwụkwọ ndị nwunye” ebe ụmụ anyị pụrụ ịmụta ihe ndị a.
Ajụjụ: Ezinụlọ gị hà nwerè oge ha wepụtarà ka ha jí ná-anọkọ́ ọnụ n'ụlọ? Jụọ onwe gị, “Afọ iri abụọ site ugbu gaa n'ihu, ihe ndị ha mụtarà n'ezi hà gà-adị mkpa karịa ihe ndị ha mụtarà n'ime ezinụlọ?”
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.
More