Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ụba Megide Ụ̀kọ́

Ịzụlite ụmụaka siri ike. Ọ bụ̀ otu n'ime ọrụ kachasị sie ike. Ènweghị akwụkwọ ederè dị ka agà esi arụ ya, ọ dịghị usoro akwadeberè dịnụ, ma Chineke ana eme ihe anyị n'atụghị anya site n'ime ka nwa ọbụla dị iche. Ka oge n'aga, gị ana ejigidesie ike ụkpụrụ ọbụla dị mma n'uche gị; ịnà anwa ya, ọ rụọ ọrụ, ya abụrụ nke gị iji n'eme ihe.

Ya merè aga m atụ arọ otu ụkpụrụ tinye ná ndị ijì eji: mepụta ọnịnọ ụba maka ụmụ gị.

Ụmụaka chọrọ ịhụnanya ma ya adịkwa ha mkpa. Dịka ihe niile nọ n'ụwa a, ọ bụrụ na ọ dị n'ụ̀kọ́, mgbe ahụ ka uru ya gà-abawanye ma ya ana akpata esemokwu. Mana ọ bụrụ na ọ dị n'ụba, nsogbu agaghị adị.

Wèré mmanụ na nnu dịka ọmụmaatụ. Mbà ọbụla chọrọ mmanụ ụgbọala, ya merè na enwerè asọmpi dị ọkụ maka ya. Ọnụ ego ya dị elu mà kà gà-arikwú elu. Anyị nà-alụ ọgụ, na-aghọ aghụghọ, n'enye aka azụ, n'ere mkpụrụ obi anyị maka mmanụ.

N'aka nke ọzọ, nnu bụ ezigbote ihe dị mkpa maka obibi ndụ, mana o jurù eju. Ọnụ ego maka igbe nnu bụ̀ nwa peni peni. Nnu dị n'ụba.

Mgbe ndị nna na ụmụ ha adịghị emekọrịta, mgbe ha ji ọrụ dochie ohere ha niile nke nà ụmụ ha ana enwe mmetụta na ha adịghị mkpa, mgbe ọnịnọ nna dị ụ̀kọ́ ma ọ dịghị mgbe n'ezie o nwerè ohere ka ya na ụmụ ya gwuo egwú ma ọ bụ kpaa nkata, nke ahụ bụ ọnịnọ nke ụ̀kọ́.

Mana mgbe ndị nna n'enye ịhụnanya n'adịghị agwụ agwụ, mgbe ọnịnọ nna dị nnọgide na dị n'uju, agaghị enwe ọtụtụ esemokwu, aghụghọ, ma udo gà-adịkwa ụba n'ụlọ. Nna kwesịrị ịnọ ya n'anụ ahụ ma na nke mmetụta-uche.

Ọnịnọ nke ụba adịghị abịa n'onwe ya, ọ dịghịkwanu mfe ịmepụtà.

Mana ọ dị ezigbote uru.

Ajụjụ: Ụlọ gị ọ bụ̀ nke ọnịnọ ụba ka ọ bụ̀ nke ọnịnọ ụ̀kọ́? Ụmụaka n'ètó nke ọma n'ọnịnọ gasị nke ịhụnanya jupụtara na ha. Mana ha gà-alụgbú onwe ha n'ọgụ ma n'ata ahụhụ n'ọnịnọ gasị nke ụ̀kọ́.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Radical Mentoring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://radicalwisdombook.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara