Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Nna Nwéré Obere Ịta Aka N'eze

E nwerè oge azụmahịa mgbe “ụzọ iji ụbụrụ̀ eme ihe” nọ n'achí. Anyị kepụtarà ụzọ arụmihe gasị wee n'agbasi mbọ ike inwe ihe ịga nke ọma kachasịnu na kà ihe gá-akpatá ọdịda dị obere. Anyị tụrụ kàlùkàlù nke na ọ bụrụ na anyị mee ụfọdụ ihe, na anyị gà-enwe mmeri ọtụtụ oge.

Dịka ndị nna, anyị achọghị iji ụmụ anyị “tụọ kàlùkàlù”. N'agbanyeghị ihe ọbụla anyị merè, anyị apụghị ijide n'aka na ha gà-eto ghọọ ndị okenye má ihe mà n'akpa àgwà ọma, n'eso Jizọs. Mana, anyị pụrụ ime mkpebi gasị gá-ahụ́ na ịta aka n'eze anyị, ọ bụrụ ma ọ bịa, gà-adị ezigbo obere! Anyị pụrụ ịhọrọ ịhapụ ime ihe ndị gá-ebuteré anyị ịta aka n'eze n'ọdịnihu.

Ọtụtụ ndị nwoke n'ebi ndụ pá ọnyá sitere na Nna Gasị n'ejikwaghị ire ha na iwe ha. “Ndị nna, unu akpasulá ụmụ unu iwe wee mee ka ike ụwa gwụ ha; kama ya, zụlite ha n'ime ọzụzụ na ndụmọdụ nke Onye-nwe-anyị.” Ọ dịkarịa ala, anyị kwesịrị ịkwa ire anyị nga. Jíkwaa ntụcha anyị na iwe anyị. Anyị adịghị amakarị na anyị n'eme ha . . . ruo mgbe anyị kpacharà àgwà ọjọọ ndị a.

Ọtụtụ n'ime anyị ka agụụ gụsirì ike ịnụ okwu otuto na nkwalite-mmụọ site n'ọnụ nna anyị, mana nke ahụ emeghị. Ọ nà-adị egwù ka mpako si eme ka anyị n'akpa àgwà ka ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. Anyị pụrụ inyà ehi egwuregwu eletrik, ọgbatụ̀mtụ̀m, na bọọdụ̀ eji egwù egwuregwu mmiri, mana anyị agaghị akụnyú ụjọ anyị n'adọ anyị n'obi n'anyị gà-ada ka ndị n'amaghị ihe na ọ bụ ndị n'esighị ike ka mmadụ ma anyị gwa ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ka ha si dị ọpụrụichè nye anyị na ka anyị si hụ ha n'anya.

Ìjì obi gị na ihe gị niile n'azụlite ụmụ gị? Ị̀nà eme ọzụzụ kà nna ka ịta aka n'eze, ọbụrụ ma ọbịa n'ọdịnihu, gà-adị ezigbo obere?

Ajụjụ: Ị̀gà arịọ Chineke ka O gosi gị ihe kachasịnu ịgà eji taa aka n'eze ka nna n'ọdịnihu? Mgbe ị rịọcharà Ya nke a, rịọ Ya ka O nye gị obi ike na agbamume ịgà eji luso ihe ahụ ọgụ na hazie ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Radical Mentoring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://radicalwisdombook.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara