Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá: Njem Ụbọchị Asaa Maka Ndị NnaIhe Nhụchatụ

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Ndị Nna N'eso Jizọs

Ndị nna n'eso Jizọs nà-amalite site n'inyere ụmụ ha aka ịghọta ndị ha bụ̀ n'ime Kraịst. Nwa gị ọ mà na ya bụ nwa anabatarà n'ime ezinụlọ Eze Ndị Eze—nwa agbaghàralà n'ụzọ zuru ezù, nke ọ n'adịghị ihe agà asị kọrọ ya, ruru eru ịnata na inwe ihe ọma niile n'ụzọ zuru okè?

Mgbe ụmụaka ghọtarà ndị ha bụ̀ n'ime Kraịst, ha nà-achọpụta onye ha bụ̀ n'ezie bara uru. Onye a ha bụ̀ n'ezie n'eme ka ọ dị oké mfe ịma ihe ha kwesịrị ime mgbe mkpebi ime ihe dị mma na ihe dị njọ edochaghị anya, ma ọ bụ̀ mgbe nne na nna si mba nye mkpebi ha merè dị mma n'anya ha.

Ka ha si echè echichè nà-agbakwasi ukwu na “Kedụ ihe Jizọs gà-achọ ka m mee n'ihe a?” n'ihi na onye ha bụ̀ n'ime Kraịst bụ̀ mgbakwasị-ụkwụ nke ndị ha bụ̀.

Ndị enyi m Craig na Kerry nwerè ụmụ nwaanyị atọ mara mma. Mgbe ha gà-achọ ime mkpebi gasị banyere uwe na-emepe ahụ na nke n'egosi ara ha, Kerry n'ajụ́ ha si, “Ùnù chè na nke ahụ kwesịrị ekwesị ka unu yìnyé ya nà-ahụ?” Ọtụtụ ụmụaka gà-enupù isi, n'echè na nne ha n'achọ itinye uche nke ya n'ụbụrụ ha.

Mana ụmụ nwaanyị ndị a etogólichaalá ihe ndị ha bụ̀ n'ezie banyere onwe ha . . . ihe ndị ha chè kwesịrị ekwesị na ndị ha agaghị etinye n'uche ha. Ha agbanáriilá ọtụtụ esemokwu nke ihe e kwesịrị iyi na ihe ndị ana ekwesịghị iyi n'ihi na ha ejila aka ha chee echiche banyere ha wee mee mkpebi mara mma n'eto Chineke. “Amaarà m onye m bụ̀. Ndị dị ka m adịghị eyi ụdị ihe ahụ. Ndị dị ka m adịghị eme ụdị ihe ahụ.”

Ajụjụ: Ịgà eme ka ụmụ gị lekwasị anya na uche nà ụdị mmadụ ha chọrọ ịbụ, gị ana edu ha ka ha mara ndị ha bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Radical Wisdom: A 7-Day Journey For Fathers

Ọ dị ezigbo ịtụnanya otú nna anyị nke ụwa si eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀. Ọ dịghị onye na-agbanari ike na mmetụta nke nna ha nke ụwa. Mana ebe ọ nà-adị ọtụtụ ndị nwoke ka ha adịghị njikere ịbụ nna, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ nduzi – site n'Okwu Chineke nakwa na site n'aka ndị ọzọ bụ́ nna. Amamihe N'adịghị Ka Nke Amà Amá bụ njem n'eduga na amamihe na nghọta-ime maka ndị nna, na-ekpokọta ụkpụrụ gasị na amamihe sitere na Akwụkwọ Nsọ jirí ahụmahụ nke otu nwoke bụ nna katụrụ nka, makwụ ihe ugbu a, onye mụtagoró ihe site na mmehie na mmejọ ya niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Radical Mentoring maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://radicalwisdombook.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara