Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Nehemaya Wùlirì Mgbidi Ahụ
Nehemaya nụrụ ọkpụkpọ-òkù Chineke iga wulite mgbidi ahụ dị na Jeruselem. N'oge a kpọrọ ya, ọ nọ n'obodo ndị ọzọ na-arụrụ otu eze ọrụ, ebe ahụ bụ̀ ebe dị anya n'ihe o nwerè n'obi ime. Ma, dị ka nanị Chineke pụrụ ime, O megheerè ya ụzọ ma mee ka Nehemaya gaa n’ihu n’ọkpụkpọ-òkù ya.
Otú ọ dị, ọrụ ahụ adịghị mfe. Mgbidi ahụ dara pìtì. Ụmụ Izrel gbasasirì agbasasì. Ndị iro ga-abịarírí, ha mechakwarà bịa.
Mgbe ndị iro nụrụ ihe Nehemaya chọrọ ime, ha bịara imegide ya. Ha kwara ya emo, kpasuo ya iwe, na-ezube ime ya ihe ọjọọ. Ọ dị nnọọ njọ nke na Nehemaya kenyerè ọkara ndị ikom ya ka ha jiri ngwá-agha na-eche nche ma ọ bụrụ na ndị iro ha abịa. Nke a ga-enye nchekwa mana o merè na oge ọ ga-ewe iji wuchaa mgbidi ahụ adị ukwuu.
Mgbe m gụrụ akụkọ a, n'ime obi m a nụrụ m olu robot nke ihe nkiri 'Lost in Space' ka ọ n'ekwu, “Danger, Will Robinson.” Amaghị m banyere gị, mana ọ bụrụ m, m nwerè ike ihapụ ọrụ ahu. Ọ bụ ọrụ n'ewe ọtụtụ ihe, mgbe ị gbakwụnyerè ihe egwù nwere ike ime, ikekwe ị pụrụ itunye ndụ gị n'ihe ize ndụ, i ghaghị ijidesì mmesi obi ike Chineke nyerè gị maka ọkpụkpọ-òkù gị ike.
N'agbanyeghị ihe ndị a, Nehemaya tachiri obi. Ọ bụghị naanị na ọ tachiri obi, ndị na-eso ndú ya mekwarà otú ahụ. Amaokwu nke isii na-ekwu, sị, “N’ihi na ndị mmadụ ji obi ha nile rụọ ọrụ.” Nke a bụ MGBE iyi egwù bịara —ọ bụghị mgbe ọ n'abịabeghị. Ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ ñomiri ya mgbe ha hụrụ ahụhụ na ịtachi obi Nehemaya nwerè na mkpebi siri ike imezu atụmatụ Chineke. Nke ahụ bụ ihe atụ dị ike nye onye ndú nke ike n'agwụ.
Ihe jikọtara-aka na ntachi obi ha bụ àgwà ha nke ekpere. Ha tikurù Chineke. N'ezie, ha merè otú ahụ tupu ha emee ihe ọ bụla iji guzobe ndị nche maka nchebe. Ebe mbụ ha cherè ihu bụ ekpere—ihe kacha mkpa ha nwere ike ime. Ma mgbe ha merè nke a, ọ kpalirì Chineke. Chineke zarà wee bịa gbachitere ha.
Ọ dị mkpa idobe ekpere n’ihu mgba gị. Mee ka o kpalie gị, chetara gị, ma mee ka ị na-elekwasị anya na ịtachi obi. Ekpere dị mkpa maka ntachi obi.
Ozugbo e wucharà mgbidi ahụ, Akwụkwọ Nehemaya mechirì n'igwa anyị na mba ndị gbara Ụmụ Izrel gburugburu hụrụ ihe merenụ ma kwuo na ọ bụ Chineke merè ka ọ bịa na mmezù. Ikwesị-ntụkwasị-obi Nehemaya abughi naanị na o merè ka a rụchaa ọrụ ahụ, o nyerè Chineke otuto n’ụzọ na-agaghị eme eme ma a sị na ọ darà mbà n'ihe a kpọrọ ya ka ọ rụọ.
Ekpere m bụ ka ije òfùfè a dị ụbọchị asaa nye gị mkpali n'ime mmụọ gị ka i dị ike n'aga n'ihu adaghị mbà. Cheta nà nkwa Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Echefula ndị ikom na ndị inyom n'ime Akwụkwọ Nsọ ndị na-adaghị mbà mgbe ụwa na-emegide ha. Gị onwe-gị kwa, nwerè ike ime ka ha site na imeri oke ifufe ahụ n'achọ ilo gị, enyi m.
Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume ọzọ, biko gaa na webụsaịtị m maka ọtụtụ akụrụngwa bara uru maka ihe ndị ahụrụ anya i pụrụ ime iji merie mgba ndụ n'ezie http: //www.brittanyrust.com.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.
More