Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Don't Give Up

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ụbọchị Nke Ise—Josef Na Nrọ Ya

Josef bụ nwa okorobịa rọrọ nrọ. Nrọ nke mere ka ịkpọasị nke ụmụnna ya nwerè maka ya bawanye ụba, n'ihi na ọ bụ nwa nwoke nna ha kachasị hụ n'anya. Nrọ ahụ bụ na otu ụbọchị ezinụlọ ya ga-akpọ isi ala nye ya.

Nrọ ahụ darà piatàpiatà n'ihe ọzọ mere Josef. Mgbe afọ ole na ole nke ahim obi gasịrị, ụmụnna ya merè omume obi ọjọọ wee ree ya ka ọ bụrụ ohu. Ụmụnna ya kwabarà ya na ndụ ohu na ihe isi ike, e kerè ya agbụ dịka ihe onwunwe nke onye ọzọ. Nrọ Josef n'oge a yiri ihe n'enwekataghị bịa na mmezù.

Mana Josef achisaghí aka ya n'ala ma ọ bụ nwee nkụda mmụọ n'ihi na ya bụ ohu. Kama, o ji ihe Chineke nyerè ya mee ike ya niile. N’ụlọ Pọtịfa, ọ rụsiri ọrụ ike ma dabere na Chineke. Nke a merè ka Chineke gọzie ya. Ọ bụ ebe a ka o bilirì ilekọta ezinụlọ nwoke ahụ ewee nye ya ikike ịhazi ihe niile. Ọ mụtara idu ndú, ịdị umeala n'obi na ije ozi n'ime ebe a dịka olileanya adịghị ya, n'ejigidesi nrọ obi ya ahụ ike.

Josef nọgidere ịbụ onye ezi omume ọbụna mgbe nwunye Pọtịfa bịakwuterè ya. O boro ya ebubo na ọ na-anwa idina ya, nke a merè eji tụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ihe yiri nzọghachi ụkwụ azụ bụ n'ezie nzọm ụkwụ nke iga n'ihu.

N'ụlọ mkpọrọ, Josef nwetarà ihu ọma ma bụrụ onye nlekọta ahọpụtara ka ọ na-elekọta ndị mkpọrọ—ọzọkwa, e buliri ya ịbụ onye ndú. Ọ bụkwa n'ebe a n'ulo-nkpọrọ ka o zuterè onye-isi ndị-obuu ihe-ọṅụṅụ nye eze. Josef nwerè ohere ịkọwa nrọ nwoke a, nke ga-aba uru afọ abụọ ka e mesịrị, mgbe eze rọrọ nrọ nke nkọwa ya dị mkpa.

Mgbe Josef kọwara nrọ eze banyere ụnwụ nke na-abịa, emerè ya ka ọ bụrụ onye isi ala Ijipt dum. Nrọ ya emezuwo!

Enyerè Josef ọtụtụ ọnọdụ ndị tara akpụ bụ́ ihe nwere ike ime ka ọtụtụ n’ime anyị nwee ịda mbà n'obi. Mana ọ nọgidere na-ejidesi ihe o nwere n'ime ya ike. N'ihi ya, ọ hụrụ ka nrọ ya mezurù nke nyere aka zọpụta ọtụtụ puku mmadụ, gụnyere ezinụlọ nke ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Give Up

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.brittanyrust.com