Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Don't Give Up

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Ụbọchị Nke Mbụ—Ugwu Bụ Ezie

Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị gị ka i bụ̀ ụgbọ mmiri nke owu marà ebili mmiri na-ebugharị n’ime oké osimiri. Igaa ihu, gị gaa azụ, n'atughari ma n'ese n'elu mmiri dịka onye n'enweghị ntụzịaka, na-achọ nzọpụta na nkasi obi nke olileanya, mana i nweghị nduzi. Énweghị ihe nduzi na ntụziaka gà-eme ka ngarú gị n'elu ala bụrụ ihe siri ezigbote ike.

Ọ bụ otu a ka ije anyị n'ụwa dị. Ijeghari n'enweghị akwara-nduzi mana nwee olileanya na ị ga-emezu nzube Chineke dozirì gị n’ụwa a pụrụ ịbụ ihe n'ekweghị omume. Nke a merè ugwu bụ ezie ji dị mkpa na ndụ gị, ihe-nlekwasị anya n'adịghị agbanwe agbanwe. Enwerè naanị otu ugwu bụ ezie - Aha Ya bụ Jizọs.

Ọ bụ naanị Chineke pụrụ inye gị ume na ntachi obi maka ndụ na-amị ezi mkpụrụ. Mgbe ike gwụrụ gị, ogwe aka Ya sírí ike ga-ekpudo gị wee kùnyé ndụ ọhụrụ n'ime ọkpụkpụ gị nile. Mgbe ihe ụwa na-eti gị ihe nke ukwuu rue na i nweghi ike iweli otu nzọụkwụ ọzọ n'ihu, isi iyi nke ndụ Ya ga-ebili ma jupụta n'ime gị ọzọ. Mgbe i furu efu, ejighị ihe ọbụla n'aka, amamihe Ya na nghọta Ya na-emeghe anya gị nke ike gwụrụ wee nye gị ìhè maka njem dị gị n'ihu.

Nàrá mmesi obi ike! Ọ dịghị ezi ugwu ọzọ, ọ dịghị isi iyi nke ike ọzọ pụrụ inye gị nkwagide, ọ dịghịkwa ìhè ọzọ ga-eduzi gị nke ọma. Hapụ azịza ụwa maka ike ọgwụgwụ gị ma nabata ezi ugwu gị. Ọ bụ naanị Ya bụ̀ isi iyi nke nkwado gị na njigidesi-ike gị n'ime ihe nile.

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka i bụ̀ ụgbọ mmiri n'akwaghari n’etiti ebili mmiri ụbọchị taa, tupu ị na-achụ ihe ọ bụla ọzọ, chụsoo Jizọs. Ka Onye-nwe-anyị duzie obi gị, kwe ka ike Ya burú gị gabiga na ndagwurugwu ahụ dị njọ ọbụna mgbe ọ dịka ike chọrọ ịgwụ gị. 

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa, anyị ga-ebu ụzọ banye n'ime Akwụkwọ Nsọ wee chọpụta ihe Chineke na-ekwu gbasara ntachi obi na ndidi. Nke a ga-abụ ihe ncheta gị na agbam ume gị ka ị ná-agá n'ihu mgbe ọ gà-esi ike. N’ihi ya, bịa sonyere m kpughee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru maka ntachi obi na ihe ọ na-arụpụta, na ndị ọzọ nwere ntachi obi n'ime Akwụkwọ Nsọ n’agbanyeghị ahụhụ ha gabigarà.

Ma cheta: Enyi m, anya gị dịgide na Jizọs!

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Give Up

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.brittanyrust.com