Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Don't Give Up

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Ụbọchị Nke Atọ—Ịnọgidesi Ike Maka Ndị Ọzọ

Pọl maarà ihe isi ike nke ọma. A tụrụ ya mkpọrọ, tie ya ihe, ụgbọ mmiri ya kpurù, agụụ gụrụ ya, ike ọgwụgwụ tara ya ahụhụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ gabigara n’ihi ozi Kraịst. Mana, site n'ihe a nile, ọ nọgidesiri ike. O ji ike na obi wee na-aga n'ihu. Ma o meghị nke a naanị maka Kraịst—o merè ya maka ndị ọzọ.

Ee, rịba ama anyị na-ebi n’ihe ize ndụ nke ọnwụ mgbe nile n’ihi na anyị na-ejere Jizọs ozi, nke a bụ ka ndụ Jizọs pụta ìhè n’ahụ́ anyị n'inwụ anwụ. Ya merè, anyị na-ebi ndụ n'ihu ọnwụ, ma nke a emewo ka ndụ ebighị ebi bụrụ nke anyị."

Pọl maarà na ịtachi obi n'ihe isi ike merè ka o nwee ohere inye Kraịst otuto, nke rụpụtara na nzọpụta nke ọtụtụ mmadụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa gị na otù i si ebi ndụ gị. Mgbe ị na-atachi obi n'oge ihe siri ike, na-ejidesi ezi ihe na ihe ọma ike, ndị mmadụ na-ahụ ya. Mgbe ha hụrụ ka i si ebu onwe gị n'oge ọchịchịrị, ha gà-achọ ịmatakwu banyere gị na ebe ike gị si abịa.

Nwanne m nwoke nke m tọrọ gosipụtara nke a nke ọma n'oge ihe siri ike na ndụ ya. Mgbe ọ ka bụ ezigbo nwa okorobịa, ya na enyi ya nwaanyị nwere mmekọahụ ma ha abughi di na nwunye. O merè ka nke nwaanyị tụrụ ime, bụ́ nke ha chọpụtara n’ụbọchị ga-abọ echi ya nwanne m chọrọ ịrịọ nke nwaanyị maka ọlụlụ. Ha merè ihe n'adịghị mma. Mana ha amaghị ihe ndị pụrụ isi na ya apụta.

Obere oge ka nwanne m nwoke na enyi ya nwaanyị matarà na nke nwaanyị dị ime, ha abụọ kewapụrụ, nwanne m ahụghịkwa nke nwaanyị ọzọ ruo mgbe ọ mụsịrị nwa ya nwanyị. Ọ bụ oge obi mgbawa dị egwù nye nwanne m nwoke. Ọ bụghị nanị na o funahurù nwaanyị ọ hụrụ n’anya, ọ bụkwa na o funahurù ahụmahụ ihu ọbịbịa nwa ya nwaanyị n'ụwa.

Ihe dị ịrịba ama bụ otú o si jiri okwukwe na nrubeisi jee ije n’oge ahụ. O jere ije mgbahapu nke mmehie ya, wee chọta ọgwụgwọ obi na mmekọrịta-chiri-anya n'ebe Nna ya Eluigwe nọ. Ndị maara ya—ụfọdụ ndị na-ekweghị ekwe—chọpụtara nnọgidesi ike ya n’oké ifufe ahụ, wee ji anya ha hụ na ike ya a si n'ebe Chineke nọ. Ihe isi ike ya wetaaraà Chineke otuto n’ụzọ mara mma. Obi dịkwa m ụtọ ikwupụta na Chineke gbapụtara mmekọrịta ya na nwaanyị ahụ, na ha abụọ mechara luo di na nwunye wee mụta ụmụntakịrị abụọ!

Ana m ekerịta nke a n'ihi na anyị niile nwere oge mgbe anyị chọrọ ịkwụsị n'ihi ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ. Mana ime nke a ekwesịghị ịdị anyị n'obi. Anyị kwesịrị ịdị ike na-aga n'ihu n'agbanyeghị otú oge ma ọ bụ ihe si we sie ike. Ntachi obi gị ga-abara gị ezigbo uru, wee mesikwaa ndị ọzọ obi ike. Ntachi obi gị nwerè ikike iché ndị mmadụ ihu na Kraịst, na-eduga ha na ndụ gbanwere agbanwe!

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Give Up

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.brittanyrust.com