Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Isii—Nwaanyị Isi Mkpe Ike N'adịghị Agwụ
Akụkọ nwaanyị isi mkpe anọgidela na-agba m ume wee n'eme m ka m nwee ntachi obi ma meekwa ka m kwuru chịm n'ihu ọnwụnwa m. Echetara m mkpebi siri ike na ikwesị-ntụkwasị-obi nwaanyị ahụ mgbe m chọrọ ịda mbà. Ọ bụ akụkọ ya na-enye m olileanya mgbe olileanya m maliterè ibelata.
N’ilu ahụ Jizọs tụrụ, e nwerè otu nwaanyị di ya nwụrụ nke na-achọ ikpe ziri ezi, o wegara ikpe ya n’aka onyeikpe na-enweghị ọmịiko. Na mbụ, onyeikpe a gọnahụrụ ya—ugboro ugboro n'enweghị mgbanwe obi ọ bụla. Mana nwaanyị ahụ di ya nwụrụ adaghị mbà. Ọ gbalịsiri ike na-arịọ maka ikpe ziri ezi, ọkàikpe ahụ mecharà kweta arịrịọ ya. Gịnị kpatara nke a? Ọ ka yabụ nwaanyị hapụ isogbù ya ọzọ!
Jizọs garà n’ihu n’ihe mmụta ahụ we si na ọ bụrụ na onyeikpe ahụ nke n'enweghị ọmiko kperè ikpe ziri ezi nye nwaanyị ahụ di ya nwụrụ, bụ́ onye ọ na-echeghị ihe ọ bụla banyere ya, mana n’ihi na yabụ nwaanyị nọgidesiri ike n'arịrịọ ya, o kperè nye ya ihe ọ achọ, olee otú Chineke agaghị-esi zaghachi ụmụ Ya karịa mgbe ha wetara Ya arịrịọ ha.
Chineke dị mma ma kwesịkwa ntụkwasị obi. Ọ bụ̀ Onye Ezi Omume, Ọ n'anụkwa ekpere ndị-Ya n'ezie. A gà-enwe oge mgbe ọ ga-adị gị ka à ga-asị na ekpere gị na-ada na ntị chiri echi, ma ọ bụ na Chineke nwerè ike Ọ dighi echebara gị echiche ka ndị ọzọ. Anọọla m ebe ahụ, ọ bụ ebe siri ike. Nwanne m jisie ike, adala mbà!
Nwaanyị di ya nwụrụ akwụsịghị mgbe ọ na-ario onyeikpe ahụ n'ezighị ezi arịrịọ. N'iburú nke a n'uche, gbaa onwe gị ume ka ị nọgide na-achụso ezi Chineke maka ihe ndị ahụ dị gị mkpa. Ọ na-anụ olu gị n'ezie. O nwerè ike Ọ gaghị aza kpọmkwem na mgbe ị ga-achọ, mana Ọ ga-azaghachi mgbe niile n'ụzọ zuru oke n'oge kwesịrị ekwesị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.
More