Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Don't Give Up

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Ụbọchị Nke Abụọ—Imawanyé Àgwà Gị Mma

O nwerè ihe mara mma banyere ntachi obi mere nà o nwerè ikike n'enweghị atụ inụchà gị. A na m eche na ọ dị ka ọkụ emerè maka inụcha ọlaọcha, n'ewepụ adịghị ọcha, adịghị mma, ma n'ewusi àgwà ike. Ọtụtụ mgbe, n'ihi na ntachi obi na ọnwụnwa na-aga aka na aka, ọnwụnwa n'ere ka ọkụ wee na-arụpụta ntachi obi.

Otu n’ime ihe ịtụnanya dị n’itachi obi ruo ọgwụgwụ ije bụ nrụpụta site na ya, àgwà yiri nke Kraịst. Ọ na-eme ka ị bụrụ onye ka mma site n'iwepụ ọdịdị mmehie ma zụlite mmụọ nke nwere obiọma, dị umeala n'obi, nwere ndidi, na nke kachasị ihe niile, na-etinye Kraịst n'ihu ihe niile.

Ndị Rom 5 na-enye ụkpụrụ maka njem a. Ọ bụghị ihe dị mfe mana ọ bụ ihe dị mkpa maka ndị kwere ekwe ọ bụla. Ọ na-amalite site na mkpebi ịṅụrị ọṅụ n'ime nhụjuanya gị. Mgbe ị nwerè ike ime nke a, ị na-enweta ntachi obi na-enwu ka ọkụ, nke na-emepụta àgwà mara mma.

Ọ bụrụ na ị nwerè ike ime njem a, akwụkwọ Ndị Rom na-asị na àgwà gị gà-amawanye mma. Ma ọ kwụsịghị ebe a. Ndị Filipaị 1 na-ekwe nkwa na ọ bụrụ na gị ejiri ntachi obi gbaa ọsọ ndụ gị site na mbido ruo ọgwụgwụ, Chineke ga-arụcha ọrụ ọma ahụ Ọ maliterè ịrụ na ndụ gị n’afọ ndị niile gara aga mgbe i tụgharịrị wee debe obi gị n’ebe Ọ nọ.

Izu ike nwerè ike dị gị ka ihe dị oké anya ugbu a, mana otu ụbọchị, ị ga-akwafe n’ụlọ gị—nke Kraịst na-akwadebe—ọ ga-abụkwa ebe ahụ ka ị ga-ahụ mmezù. Ị gà na-eje ije, enweghị nrụgide mmehie, n'uju nke onye Chineke kerè gị ka ị bụrụ.

N’agbanyeghi na ọ na-adị gị ka i kwụsị ọsọ na ije nke ndụ gị a, cheta na nnọgidesi-ike gị ga-eduga gị n’ụdị nke onwe gị ka mma, nke yiri Kraịst karịa, ka oge n'aga n'ihu.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Give Up

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.brittanyrust.com