Iké Agwụ́lá GịIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Anọ—Ụgwọ Ọrụ Dị N’ihu Gị
Ọ dịghị onye na-agba ọsọ na-anata medal ma ọbụrụ n'ogbaghị ọsọ ahụ. Ọ dịghị onye egwuregwu bọọlụ na-emeri egwuregwu bọọlụ obodo Amerịka ana-kpọ Superbowl na-enweghị ọtụtụ ihe omume na egwuregwu nsonye na-agakọ na mmeri. Ọ dịghị onye isi nri na-enweta ihe nrite James Beard na-enweghị ọrụ siri ike na mkpebi siri ike na usekwu, oge ọ n'esi nri ya (nke a bụ nkwupụta-onwe nke onye hụrụ nri n'anya ebe a!).
Isi ihe okwu ndị a bụ na ụgwọ ọrụ ọ bụla na-abịa site na ntachi obi. N'ezie, nke a nwerè ike ịpụta ihe ọma n'ụwa a ma ọ bụrụ na anyị e bụrụ ụzọ na-achọ Chineke. Ma nke ka ọnụ ahịa karịa ụgwọ ọrụ ụwa a bụ ụgwọ ọrụ ebighi ebi, nke a na-enyekwa onye kwere ekwe dị ntụkwasị obi.
Adala mbà mgbe ọnwụnwa na nwale cherè gị ihu. Agbakutala azu mgbe ike gwụrụ gị n'ihi oké ifufe. Ọbụlagodi na isi gị n'achọ imikpụ n'ime mmiri, jisie ike n'ese n'elu mmiri ruo mgbe enyemaka ga-abịa. Naanị adala mbà. Ụgwọ ọrụ ị ga-enweta ga-abụ ihe ịtụnanya!
Enwerè ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi na mmezu nke ihe niile Chineke kwere gị ná nkwa ma ọ bụrụ na i jiri ntachi obi gbaa ọsọ a. Ọ bụrụ na ị lekwasị anya na Jizọs ma debe okwukwe, ị gaghị akwa ụta maka inye Chineke ihe niile gị. Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-akwa ụta maka oge ndị ị dara mbà. Gafee ahịrị mmeri ahụ n'ike ọgwụgwụ site n'inye agbam ọsọ gị ihe niile, n'ọṅụ zuru oke, na atụmanya nke ụgwọ ọrụ Chineke kwerè gị ná nkwa.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ̀ dịtụlá mgbe ike gwụrụ gị rinne ma ọ bụ gị yie onye emeriri emeri na ndụ nke na ịchọrọ ịhapụ nile wee kwụsị ịgba mbọ ọbụla na ndụ? Akwụkwọ Nsọ jupụtara na agbamume nke i ga-eji nọgidesie ike wee ka n'aga n'ihu! Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa ga-eme ka ume gị dị ọhụrụ maka njem dị gị n'ihu.
More