YouVersion Logo
Search Icon

LUK 17

17
1O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia. 2Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà. 3Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya. 4Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.
5Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe. 6Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti. 7Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri; 8nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa? 9Ọ̀ nwere ekele n'ebe orù ahu nọ n'ihi na ọ mere ihe akaworo àkà? 10Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.
11O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. 12Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: 13ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. 14Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. 15Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; 16o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria. 17Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no? 18Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a? 19O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.
20Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche: 21ha agaghi-asi kwa, Le, n'ebe a! ma-ọbu, N'ebe ahu! n'ihi na le, ala-eze Chineke di n'etiti unu.
22O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya. 23Ha gāsi kwa unu, Le, n'ebe ahu! Le, n'ebe a! unu ejela, unu esokwala ha: 24n'ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n'otù akuku n'okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n'okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n'ubọchi-Ya. 25Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n'ọb͕ọ a. 26Ma dika emere n'ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n'ubọchi Nwa nke madu. 27Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì. 28Otú ahu dika emere n'ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n'ubi, ha nēwu ulo; 29ma n'ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n'elu-igwe zò, we la ha nile n'iyì: 30n'otù aka ahu ka ọ gādi n'ubọchi agēkpughe Nwa nke madu. 31N'ubọchi ahu, onye gānọ n'elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi. 32Chetanu nwunye Lot. 33Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu. 34Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya. 35Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya. 36Madu abua gāno kwa n'ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya. 37Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.

Currently Selected:

LUK 17: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy