YouVersion Logo
Search Icon

LUK 14

14
1O rue, mb͕e Ọ batara n'ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n'ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche. 2Ma le, otù nwoke nọ n'iru Ya nke nwere ọria aru-miri. 3Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi? 4Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la. 5O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n'etiti unu gādabà n'olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n'ubọchi-izu-ike? 6Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ.
7O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha, 8Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru, 9onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu. 10Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri. 11N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
12O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe. 13Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì: 14onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume.
15Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n'ala-eze Chineke. 16Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu: 17o we zipu orù-ya n'oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n'ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a. 18Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya. 19Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n'onye riorọ ka arapu ya. 20Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia. 21Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ. 22Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n'iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra. 23Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n'uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa. 24N'ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.
25Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha, 26Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 27Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n'azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 28N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya? 29Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya, 30si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya. 31Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya? 32Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n'ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo. 33Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 34Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ? 35O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n'èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.

Currently Selected:

LUK 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy